Anyi ka ga-eme nnyocha n'agbanyeghi na Pius na Ifeyinwa Angbo ekpeziela - Channels TV

Ebe foto si, Jimin Geoffrey/Facebook
Ọ bụ n'ụbọchị Disemba 3, 2020 ka ihe onyonyo pụatara ebe nwaanyị akpọrọ Ifeyinwa Angbo na-ebo di ya ebubo na o tiri ya ihe.
Di ya bụ Pius Angbo bụ onye ntaakụkọ n'ụlọọrụ Channels TV.
Nke a mere ka Channels TV edepụta okwu nkatọ maka mmadụ iti nwunye ya ihe.
N'agbanyeghị mkpebui udo, Kingsley Uranta, ụnụ na-ekwuchitere ndị ụlọọrụ Channels TV sị na ha ka na-enyocha ihe mere.
Nke a mere ka ndị mmadụ akatọọ agwa nwoke ahụ ọ kachasị na nwunye ka mụchara nwa n'izuụka anọ gara aga.
N'ụbọchị Monde Disemba 4, Gọvanọ na-achị Benue steeti Samuel Ortom kpeziri udo n'etiti nwaanyị ahụ na di ya.
Ihe ndị mmadụ kwuru maka mkpezi a
Otu onye kwuru bụ Adelere na ihe ọbụla mee nwaanyị ahụ n'aka di ya, ọ bụ n'isi Gọvanọ ahụ
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Eretha kwuru na mgbu ka na-egosi n'ihu nwaanyị ahụ
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Gịnị ka ụlọ ntaakụkọ Channels TV kwuru maka okwu a?
Ndị mmadụ na-ajụ ma ụlọntaakụkọ Channels TV a ga-agbachi nkịtị ka nwoke ahụ ka nwere ọrụ ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Ha na-ekwusiike na o kwesiri ị nọ n'ụlọ mkpọrọ dịka iwu ala Naịjirịa si debe.
Onye na-ekwuchitere ụlọntaakụkọ Channels TV bụ Kingsley Uranta gwara BBC na ha kwụsịke n'okwu ahụ ha kwuru gbasara nnyocha.
N'olu ya, 'O nwebeghi ihe gbanwere n'okwu anyị kwuru n'agbanyeghị na ya (Pius Angbo) na nwunye ekpeziela'.
Cheta na mgbe akụkọ ahụ pụtara n'ụbọchị ụka, ha kwuru na ha ga-enyocha ya bụ ihe ma taa nwoke ahụ ahụhụ maọbụrụ na ikpe mara ya.











