Palm Wine: Ihe isii mere mmanya nkwụ na ngwọ ji dị oke mkpa

Onye na-aṅụ mmanya ngwọ

Ebe foto si, Getty Images

    • Onye dere ya, Chigozie Ohaka
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo service

E jirila ya gụọ ọtụtụ egwu n'ala Igbo na mpaghara ndị ọzọ n'Afrịka.

Mmanya ngwọ bụ otu mmanya ndị Igbo anaghị eji egwu egwu.

Emume ọbụla ọ sọrọ ya bụrụ, a na-anabata mmanya ngwọ.

Emume oge ọọụ dịka ịgba nkwụ nwaanyị, mgbe amụrụ nwa ọhụru maọbu mgbe mmadụ chiri echiechi; mmanya na adịkarị.

Ma ọbụladị mgbe a na-eru uju, ndị Igbo na aṅụ kwa ya bụ mmanya iji kasie obi.

Mmanya ngwọ ọbara uru maka ahụike?

E nwere akụko dị iche iche maka etu mmanya ngwọ sị edozi ahụ mana ọtụtụ amaghị ma sayensi akwadoro akụko ndị a.

Aha onyonyo, Ịmaara ka Nkwụ si agba mmanya?

Iji maa atụ bụ n'akwụkwọ "Things fall apart" nwaafọ Igbo bụ Chinua Achebe dere, o gosiri na mmanya ngwọ bụ ihe n'ọgbakọ ndị ichie dịka ha si ka onye ntoroọbịa ka lụrụ nwaanyị ahụrụ ṅụọ ya ike mmanya maka na ọ na-enyere aka ịtụwa nwaanyị ime.

Ọtụtụ mkwenye ndịa juputara n'ala Igbo mana akụkọ a ga-agwa gị nke sayensi kwadoro.

Aha onyonyo, Palm wine: Mmanya ngwọ na-eme ka mmiri ara nwaanyị na-agba nke ọma

Anyị kpọturu Harrison Omonhinmin na Collins Akanno bụ ndị ọkaibe na agụmagụ ihe nrị na-enye n'ahụ nke bụ Dietician n'okwu Bekee ka ha kọwara anyị nkeọma uru mmanya ngwọ bara n'ahụike mmadụ.

Mmanya ngwọ na-enye aka maka ịhụ ụzọ nke ọma

Anya mmadụ

Collins Akanno bụ ọkaibe n'ihe gbasara nrị na ahụike ma bụrụ ọgwa oji ego achụ ego kwuru na mmanya ngwọ nwere ụfọdụ ihe ndị na-edozi ahụ nke gụnyere vịtamin A, vịtamin B na C.

Aha onyonyo, 'Ahụghị ụzọ enweghị ihe o gbochiri'

Akano kọwara na ihe ndị a na-egbochi anụ ahụ na-elekọta mmegharị anya sie ike nke ọma. O kwukwara na ndozi ahụ Potassium dịkwa na mmnaya ngwọ nke na-ahụ na anay mmiri juputara n'anya mmadụ nke ọma nke na-akwụsị anya mmadụ ịgba tịkọtịkọ.

Ọ naghị ebuli shuga dị n'ọbara

Onye na-ele shuga dị n'ọbara ya

Harrison Omonhinmin kwuru sị " n'agbanyeghị na mmanya ngwọ nwere shụga, ọ naghi ebuli shuga dị n'ahụ ndi mmadụ elu dịka mmanya ndị ọzọ.

Kedụ ka ị ga esi ma na i nwere Ọrịa shuga?

O kwuru na nke a mere ka mmanya ngwọ bụru ezigbo mmanya maka ndị na-arịa ọrịa shuga karịa nke dịka mmnaya coke nke ga-ebuli shụga dị n'ọbara mmadụ elu.

Mmanya ngwọ na-enye ike

úmú nwoke na-agba mgba

Ebe foto si, Getty Images

Harrison Omonhinmin kọwara na mmanya ngwọ nwere mgbadouem bụ carbohydrates na okwu bekee. Mgbadoume a si na mmanya ngwọ so na ihe na-enye mmadụ ike.

Ọ na-edozi obi

Dọkịta na onye na-arịa ọrịa

Ebe foto si, Getty Images

Akanno kwuru na odoma bụ potassium juputara na palmwine na-edozi mkpụrụobi. Ọ kọwara na ọ na-eme ka mkpụrụ obi na-arụ ọrụ etu o kwesiri ma mee ka ududu na uru ahụ na enyere obi aka sie ike.

Nke a na-egbochi ọbara mgbalị elu.

Mmanya ngwọ na-edozi anụ ahụ mmadụ

Ndị mma

Ebe foto si, Getty Images

Collins Akanno kwuru na mmanya ngwọ na-edozi anụ ahụ mmadụ.

Akanno kọwara na ọ bụ odoma, zịnk na magnezium dị na mmanya ngwọ na-edozi ahụ mmadụ.

Mmanya ngwọ na ọrịa kansa

Nyocha ọgwụgwọ kansa

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Ndị nyocha ka na-achọ ụzọ esi agwọ ọrịa Kansa

Akanno kwuru na mmnaya ngwọ nwere Antioxidants nke na-egbochi ihe ndị na-ebute ọrịa kansa bụ Free Radicals nke na-egbu seel mmadụ.

Nke a mere na mmanya ngwọ di mma maka igbochi ọria kansa.

Aha onyonyo, International Cancer Day: "Chineke zọpụtara m n'aka ọrịa kansa" - Anwuli Ojogwu

Akanno mara atụ si na vịtamin B2 nke bụ Riboflavin na-akwado glutathione nke na-egbochi ihe ndị na-ebute ọrịa kansa.

Ụfọdụ ajụjụ ndi mmadu na-ajụ maka mmanya ngwọ

Mmanya ngwọ ọ na-ebute mmiri ara ịgba nke ọma?

Nwa na-aṅụ ara

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Dịka ndị ọkammụta ahuike siri kọwa, ara bụ ezi nri na-eme ka ụbụrụ ụmụaka na-acha ọkụ

Omonhinmin kwuru sị na-agbanyeghị na enweghị ọtụtụ nnyocha emere maka mmanya ngwọ.

Kama o kwuru na ọdịghị mma ka nwaanyị di ime ṅụọ mmanya ngwọ n'ihi na mmnya ngwọ nwere shụga nke nwereike ịgbanwe n'ime awa iri na abụọ bụru mmanya na-aba n'anya.

Aha onyonyo, Ihe nwaanyi na-arụ ọrụ ma nọdụ n'ọmụgwọ na-agabiga

O kwuru na enweghị nycoha na-akwado na mmanya ngwọ na-enyere aka ka ara nwaanyi gbaa mmiri.

Ugboro ole ka mmadụ kwesiri ịụ mmanya ngwọ n'ụbọchị?

Onye na-aṅụ manya ngwọ

Ebe foto si, Getty Images

Omonhinmin kwuru na dịka mmanya ngwọ na-adị mma n'ahụ, na ọkpataghị na mmadụ ga-aṅụ ya ma ṅụ fee ya oke.

O kwuru sị " Ọ ka mma ka ụmụ nwaanyị nụo otu iko mmanya ngwọ kwa ụbọchị ebe ụmu nwoke nwereike ịṅụ ihe dịka iko abụo kwa ụbọchị.

Mmanya ngwọ ọ na-ebute ọrịa ọnya afọ (Ulcer)

Onye afọ na-ata

Collins Akanno kwuru sị na n'agbanyeghị na mmanya ngwọ nwere alkọhọl ruru passenti 5, na ọ naghị ebute ọrịa ọnya afọ.