Justice Chukwudifu Oputa: Ihe ị kwesịrị ịma maka nwoke ike a

Justice Oputa

Ebe foto si, Instagram/Areafada1

    • Onye dere ya, Chimamaka Ihenacho
    • Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo

Ị nụla maka Charly Boy, mana kedụ ihe ị ma maka nna ya?

Charly Boy bụ otiegwu a ma ama na onye ọnụ na-eru n'okwu n'ihe gbasara ọchịchị na Naịjirịa, mana ị ma na nna ya kpakwara ezigbo ike oge ọ dị ndụ?

Ọkaikpe Chukwudifu Oputa mere ọtụtụ ihe e ji echeta ya n'agbanyeghi na o teela ọ nwụrụ.

A bịa n'ihe gbasara iwu obodo, ide akwụkwọ, ikuzi nkuzi, kpọọ ya aha, o mechara ha niile.

Chukwudi Oputa

Ebe foto si, areafada1/Instagram

Ihe ị kwesịrị ịma gbasara nwoke a wuru ewu na Naịjirịa

  • Aha ya bụ Chukwudifu Akunne Sylvester Oputa
  • A mụrụ ya n'ụbọchị 22 nke ọnwa Septemba 1916, n'obodo Ụmụdei dị n'Ugwuta dị n'Imo steeti
Aha onyonyo, Etu esi hibe ebe a na-akpọ Ugwuta taa
  • E zigara ya na nke onye nkuzi a na-akpọ Maazị Azuwuike (Ọ gwara ụmụ ya na onye nkuzi a bụ otu onye o nwere na ndụ ya ọ na-enweghi ike ichefu), ebe ọ nọ gaa ụlọakwụkwọ sekọndịrị
  • O si ebe ahụ gaa Yaba Higher College tupu ọ gaa Achimota college dị na mba Gana, oge agha mbaụwa nke abụọ malitere, ebe ahụ ka ọ gụrụ 'Economics'
  • O si ebe ahụ gaa London, ebe ọ nọ gụọ maka ihe mere mgbe gboo nke Bekee kpọrọ History, o mechara gụọ iwu (Law) ma gaa nke a na-akpọ "law school" na mba ahụ, ebe a nọ nye ya ikike ịrụ ọrụ dịka onye ọkaiwu n'afọ 1953
  • Ọ kwụsịghị ebe ahụ, ọ lọtakwara Naịjirịa bịa mepee ụlọọrụ ndị ọkaiwu ebe ọ rụrụ ọrụ ọtụtụ afọ
  • O kpere ọtụtụ ikpe gbara ọkpụrụkpụ, nke gụnyere okwu echichi pụtara n'Ugwuta n'afọ 1959 nakwa nke ndị Amayenabo nke ndị Rivas steeti n'afọ 1960
  • N'afọ 1966 e mere ya Ọkaikpe nke Ụlọikpe ukwu nke dị na mpaghara ọwụwa-anyanwụ
Chukwudifu Oputa na Nnamdi Azikiwe

Ebe foto si, Areafada1/Instagram

Nkọwa foto, Chukwudifu Oputa na Nnamdi Azikiwe
  • N'afọ 1976, e bulie ya n'ọkwa, mee ya ọkaikpe kachasị nke Imo steeti
  • N'afọ 1984, e mere ya Ọkaikpe ndị Ụlọikpe kachasị na Naịjiria, bụ ebe ọ rụrụ afọ ise tupu ọ laa ezumike nka n'afọ 1989
  • Onyeisiala Olusegun Obasanjo si n'ezumike nka kpọpụta ya ịbịa nọrọ n'isioche ihe a kpọrọ "Oputa panel" bụ maka nnyocha ikike dịrị onye n'oge ọchịchị ndị agha site n'afọ 1984 ruo afọ 1999 (Human Rights Violation Investigation Commission of Nigeria)
Aha onyonyo, Jụọ ndị na-achị gị ihe ha ji akụnaụba ọha mee - Charly Boy
  • O dere ma biputa ọtụtụ akwụkwọ karịrị iri anọ, bụ ihe ọ nọ na-arụ n'ọtụtụ afọ ndị ahụ ọ lachara ezumike nka tupu Obasanjo akpọghachị ya ọrụ
  • Ọ kwụsịghịkwa ikuzi nkuzi, n'ihi na inyefe ndị mmadụ amamihe o nwere masịrị ya nke ukwu
  • Ọ lụrụ nwunye ya bụ Margaret Ntianu Oputa, ma mụọ ụmụ ise, nke otu n'ime ha bụ Charles 'Charly Boy' Oputa, otiegwu a ma ama, nwa ya ọzọ sorokwara nzọmụkwụ ya wee bụrụ ọkaiwu
OKaikpe Oputa, Nwunye ya na Charley Boy

Ebe foto si, Areafada1/Instagram

Nkọwa foto, OKaikpe Oputa, Nwunye ya na Charley Boy
  • Etu nwa ya bụ Charly Boy si kwuo, ọ bụ nwunye Maazị Chukwudifu gbasiri mbọ ike ịhụ na o mechara bụrụ Ọkpaikpe
  • Oge ọ dị ndụ, e chiri ya echichi 'Ogbuagu'
  • Otu ihe o jighi gwuo egwu na ndụ ya bụ ihe gbasara Chukwu nakwa okpukperechi; o bu ihe gbasara ụka Katọlik n'isi
Charkey Boy na nna ya

Ebe foto si, areafada1/Instagram

Nkọwa foto, Ọkaikpe Oputa na nwa ya 'Areafada'
  • Onye ndu ndị Katọlik nke bụ Poopu ji aka ya chie ya echichi Knight, e chiri ya Knight of St. Mulumba, Knight commander of St. Gregory the great nakwa Knight of St.Sylvester
  • O so n'otu n'ime ndị lụrụ agha Burma
  • Ọ nwụrụ ka ọ dị afọ 98, n'ụbọchị anọ nke ọnwa Mee 2014 ka ọ rịaturu nwaobere ọrịa.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: