EEDC: Ọsịsa ajụjụ na-agbagwoju gị anya maka mita ọhụrụ

Onyeisi ụlọọrụ 'Enugu Electricity Distribution Company' (EEDC) na-ahụ maka ọkụ latrik aha bụ Okey Nwosu akọwala ihe na-ebute nghọtahie maka mita ọkụ latrik ọhụrụ na steeti ahụ.
Ọ kọwara nghọtahie ndị a nile dịka ajụjụ ndị mmadụ na-ajụ.
Gịnị mere e ji chọọ ịgbanwe mita ochie?
Nwosu kọwara sị, "Ndi na-ezu ohi ọkụ ekweghị ka anyị na-enweta ego ọkụ anyị zụrụ.
Nke a mere na anyị eenwe ike izụta ọkụ ga-ezuru mmadụ niile nke butere na ọkụ anaghị adị etu o kwesịị."
" Mịta emela ochie. O nweghị nkwado teknụzụ ọhụrụ ga-enye aka ịgụkọ ọkụ etu onye siri mụọ ọkụ ya."
"Anyị enwetaghị akwụkwọ ozi maka mgbanwe mita ochie"
Dịka ụfodụ ndi mmadu na-ewe iwe na akwụkwọ ozi mịta ọhụrụ a eruteghị ha, Nwosu kọwara na ọ bụghị mmadụ niile ka atụmatụ a metụtara kama na ọ bụ ndị Mita ọkụ ha ruru igbanwe ka ha zịgara ozi.
"Kedụ ihe mere unu ji malite igbanwe Mita ọkụ? "
Okey Nwosu kwuru sị, " Mgbanwe mita ọhụrụ a dị mkpa iji kwụsi izu oku latrik bụ ihe kacha ebutere EEDC njọ ahia ma mee ka ha na-emefụ ego.

Ebe foto si, EEDC
O kwukwara na ihe ọzọ bụ na mịta ochie na-esi ike imezi ma o mebie.
" O nwere ihe mita ọhụrụ a ga-eme iche ?"
Nwosu sị na Mita nke ọhụrụ a pụrụ iche ma nwee kwa amamihe nke ya nke ga-enyere ya aka ka o gosipụta ohi ọku latrik ma ọ bu nrụrụaka ọbụla.
"Kedụ ndị ga-enwezi Mita ọhụrụ a?"
"Ọ bụ ndị ahia anyị ga-enwe Mita ọhụrụ a ma sịkwa na onye ọbụla chọrọ ị buru Mita oku a gaa ebe ọzọ ga-agwa ndị EEDC.
Akụkọ ka na-abịa









