The Nigerian Nightmare: Lee Kamaru Usman, dimkpa Naịjirịa nwere 'single bone'

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Aha mmadụ niile ọbụla kpụ n'ọnụ ugbua bụ Kamaru Usman, nwaafọ Naịjirịa ji ọgụ eme nri.

Usman na Colby Covington chịpụrụ ya n'isi ụtụtụ Sonde n'ọgụ UFC.

Ha na-azọ mgbanukwu nke 'welter weight' division.

Mana Usman ji ọkpọ kụwachaa Covington ọnụ ma maburu ya bụ mgbanukwu lawa.

Nke a pụtara na ọbụ Usman bụ naanị Eze ga-akwụ ọtọ na ogogo 'welter weight' nke UFC.

Onye bu Kamaru Usman?

A mụrụ Kamaru Usman n'Auchi, Edo steeti Naịjirịa n'afọ 1987.

Nna ya jiburu ọkwa 'Major' n'otu ndị agha Naịjirịa, ebe nne ya bụ onye nkuzi.

Ọ gafere mba Amerịka n'afọ 1995 oge ọ dị afọ asatọ.

Usman malitere egwuregwu ịgba mgba oge ọ banyere ụlọakwụkwọ sekọndịrị na Bowie High School, Arlington, ma bụrụkwa ọkaibe na mgba oge ọ banyere mahadum Nebraska.

N'afọ 2015, Usman banyere asọmpi a kpọrọ 'The Ultimate Fighter', ebe ọ nọ turu ugo wee banyezia 'Ultimate Fighting Championship' (UFC).

Kamgbe ọ malitere ịlụ ọgụ na UFC, onwebeghị onye meriri ya ruo taa.

Ụmụ Naịjirịa ndị ọzọ nọkwa n'asọmpi UFC

Isreal Adesanya bụkwa nwaafọ Naịjirịa ọzọ a ma ama n'egwuregwu UFC.

Adesanya hapụrụ Legọs ebe a mụrụ ya gafee Ghana n'afọ 1999, si ebe ahụ gafee mba New Zealand ebe ọ nọ malite egwuregwu ịlụ ọgụ.

Ugbua, ọ bụ Adesanya bụ ọkaibe n'ogogo 'middleweight' nke UFC.

Ndị Naịjirịa ọzọ so n'asọmpi UFC gụnyere Sodiq Yusuf na Kennedy Nzechukwu.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị: