You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Kamaru Usman: Nwaafọ Naịjirịa tụrụ ugo n'egwuregwu mgba UFC
Kamaru Usman bụ onye eji "Nigerian Nightmare" mara abala na-akwụkwọ dịka onye mbụ si Afrịka tụrụ ugo ka dịke n'egwuruegwu mgba UFC.
Usman, bụ nwaafọ Naịjirịa, meriri nwaafọ Amerịka aha ya bụ Tyron Woodley na mgba nke ogige "Welter weight".
Ndị chịkọrọ ya bụ mgba sị na Usman ji ọnụ ọgụgụ 50-44, 50-44 and 50-45 mekarịa Woodley bụ onye ji bụ ugo a.
Ekele na-awụrụ Usman maka mmerị a.
Usman ga-ezụte Colby Covington iji mara ma o ga-ejidenwu ugo a ọ tụrụ mana ekwubeghị mgbe ọ ga-abụ.
Woodley n'onwe ya n'ekele Usman makana ọ sị na ọ gbara mgba ọfụma iji nweta mmeri a, mana ọ sịkwa na ya chọrọ ka ha gbagharịa ya bụ mgba.
Ọdịda Woodley dara n'aka Usman bụ mbụ o nwetere kamgbe ọ banyere n'egwuregwu mgba UFC.
Usman n'onwe ya a gbala mgba ugboro iri na isii, ma daa naanị otu ugbo.