You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ọ bụ ụjọ Efe Ajagba 'chụpụrụ' onye America n'ogige ọkpọ?
Curtis Harper bụ onye mba Amerịka ya na Efe Ajagba bụ onye Naịjirịa zukọrọ ịkụ ọkpọ kwuru na ihe mere o ji gbapụ ọsọ bụ maka ego.
Harper dị afọ 30 gwara Jordan Hardy bụ onye ntaakụkọ na ọ pụrụ ozugbo a kụrụ mgbịrịgba ka ọkpọ bido, makana ọ chọrọ ka a nụ olu ya mara ihe a ga-eme ego ole a na-akwụ ya (O kwuru na anaghị akwụlite ya ụgwọ).
Ya na Ajagba dị afọ 24 kwesịrị ịkụ ọkpọ nke 'heavyweight' n'abalị Ọgọst 24 nke 2018, mana ọpụpụ o si n'ogige ahụ dị na Minneapolis n'Amerịka pụọ mere ka Ajagba nweta mmeri na-atụpụghị otu mkpụrụ ọkpọ.
Ozugbo Ajagba pụtara ịkụ ọkpọ ka a kụchara mgbịrịgba, Harper ji ọsọ si ụzọ nke ọzọ gbapụ.
Onye na-azụ Harper bụ Nate Campbell, kwuru na omume ya emechuola ya ihu.
O dere na soshal midia sị "Nwoke a kparịrị onwe ya, nwunye ya, ndị na-akwado ya na mụ onwe m."
Ajụjụ ndị mmadụ kpụ n'ọnụ ugbua bụ "ebe ọ bụ na ọ chọghị, gịnị kpatara o ji kweta ịkụ ọkpọ ahụ ma kwere nara ego?"
Onye bụ Efe Ajagba?
- Ajagba bụ 'agada gbachiri ụzọ' nye ụfọdụ ndị na-akụ ọkpọ bidoro iji ọkpọ akpa ego ka ọ nọchitechara anya Naịjirịa n'Olimpiks nke afọ 2016.
- E meribeghị ya n'ọgụ asaa (o merichara asaa ọ kụrụ).
- Ọ rụburu ebe a na-eme achịcha nke Bekee kpọrọ 'bakery'.
- Ọ gbabuuru bọọlụ tupu ọ gafee n'ịkụ ọkpọ.
- O nwetara ihe nrite ọlaedo n'asọmpi 'African Games' e mere na Brazzaville dị na mba Repụblik nke Kongo n'afọ 2015.
- O nwetakwara ọlaedo n'asọmpi ndị ga-etozu ịga olimpiks nke 2016 e mere na Kameroon n'afọ ahụ, mere ka ọ nọchite anya Naịjirịa n'Olimpiks oge o bidoro.
Ihe ndị mmadụ na-ekwu
@Ryansongalia kwuru na ọ hụtubeghị ebe mmadụ meriri ọkpọ na-atụpụghị otu mkpụrụ ọkpọ.
@greyjohnson kwuru na mmeri Ajagba a emeela ya mmeri kacha bịa ọsịsọ kemgbe e bidoro ịkụ ọkpọ.
@kcad13 kwuru na ọ ga-agbafukwa ma ọ bụrụ ya ka onye dịka Ajagba bịara ịkụ ọkpọ.