You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Elo Ogidi: Lee ka soshal midia siri zọpụta ya n'aka ndị ntọ
Nke a bụ akụkọ na-atọ ezigbo utọ.
Elo Ogidi bụ nwata nwaanyị dị afọ anọ.
Dịka akụkọ siri ga, ọ bụ n'ụlọụka ya bụ Christ Embassy nke Lagos ka onye ntọ tọrọ nwata a n'ụbọchị asato n'ime ọnwa Julai.
Akụkọ kwuru na ha hụrụ Elo ụnyaahụ na Bini, Edo steeti.
Lee ka nne na nna ya sị enwe aṅụrị
Ọ bụghi sọọsọ ha, ndị oti egwu ama ama sokwa na-ekele Chukwu.
Eben na-eto chukwu nke ọma
Niki Laoye kwuru na akwa mmiri ọṅụ juru ya n'anya.
Chidere bụ onye nkịtị okwu amasi tiri mkpu nke ya
Frank kwuru na ya ji akụkọ na-echeta ụmụnwaanyị IPOB ha tọhapụ ụnyahụ.
Ọrụ soshal midia lụrụ
Ihe a akpọrọ social midia nwere ezigbo ike nke ya.
Ozigbo ndị ntọ tọrọ Elo, nne na nna ya bịara social media na-eti mkpu.
Ha kwụsịghị n'ebe ahụ.
Ha rịọkwa ndị mmadụ ka ha tinye ọnụ na mkpu a ha na-eti maka nwa ha.
Ndị ama ama dị iche iche n'iti egwu dịka ndị putara n'akụkọ tiri mkpu n'elu soshal midia nke ha.
Ha niile kesara foto Elo n'elu soshal media ruo mgbe ọbụrụ ihe na-ewu ewu.
Ka Chukwu ga-arụ ọrụ ya, otu nwaanyị na-arụ ọrụ n'ụlọ ndị enwe nne enwe nna na Bini kpọrọ otu akara ekwentị ọhụkwara na sọshal media, nakwa gwa ha na o nwere nwatakịrị biari n'ebe ahụ yiri nwata a ha na-achọ.
Ọ bụ oge ahụ ka ndị uweojii gawara ebe ahụ chọpụta yabụ nwata.