You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Anthony Joshua, Kechi Okwuchi na ndị ọzọ wuru n'izu a
Site n'ọgụ na mgba n'etiti Aisha Buhari na Garba Shehu ruo na ọchịchịrị kpudoro Naịjirịa izu ụka dị kpọ kpọ.
Dịka akụkọ na-arị ibe ya elu, BBC Igbo na-ewetara gị ndị ka ibe ha wu ewu.
Lee ha ebe a:
Anthony Joshua kụrụ Andy Ruiz "Don't be silly"
Otiọkpọ a ma ama bụ Anthony Joshua kụpụrụ Andy Ruiz ọkwụrụ n'anya.
O meriri ya na nzụkọ abụọ ha nwere na mba Sawudi Arabia.
Afọ sara Cardi B
Otiegwu mba Amerịka bụ Cardi B bịara njem egwu na Naịjirịa nakwa Gana.
Ndị sepụtara isi na Gana malitere iwere ya iwe n'ihi na ha chere na ọ gbajọrọ ha mana ọ bụ afọ na-asa ya.
Babatunde Fowler pụrụ, Muhammad Namianọchie
Muhammad M Nami bụ onye Onyeisiala Buahari họpụtara ga-anọchị anya Babatunde Fowler n'ụlọọrụ FIRS.
Ndị mmadụ boro onyeisiala ebubo na ọ chụrụ Fowler n'ọrụ mana ọ pụtara na oge ya abịala na njedebe.
Kechi Okwuchi
Kechi wuru na soshal midia dịka o chetara ndị ogbo ya nwụrụ na ihe mberede ụgbọelu Sosoliso n'afọ 2005.
O kelere chineke ma kwanyere ndị nwụrụ anwụ ugwu.
Ụlọikpe ECOWAS tụpụrụ ikpe Nnamdi Kanu
Ụlọikpe ECOWAS nke dị n'Abuja kachapụrụ akwụkwo Nnamdi Kanu gbara gọọmentị Naịjirịa.
Ha kwuru na o gosighị ihe akaebe na gọọmentị Naịjirịa nwụchiri ya ma megbu kwa ya.
Aisha Buhari na Garba Shehu
Aisha Buhari tipuru mkpu maka onye enyemaka di ya bụ Garba Shehu na-akapagbu ya.
Shehu na onwe ya kwuru na o nweghi onye ọ na-etinte ọnụ n'okwu ya.
"General Buhari" na ụlọntaakụkọ PUNCH
Ụlọntaakụkọ Punchi iji gosi iwe ha maka etu ọnọdụ Naịjirịa siri dị foro ntutu taa na ha ga-agbanwe aha a na-etu Onyeisiala.
Ha siri na rue mgbe ihe ga-adị mma, ha ga na-akpọ ya "General Buhari" kama "Onyeisiala Buhari".
Ọchịchịrị kpadoro ụmụ Naịjirịa
Ndị ọrụ ọkụ latrik gbara abụbọ ọrụ ihe ruru abalị abụọ nke mere na ala niile gbara ọchịchịrị
Ha kwụsịrị abụbọ ọrụ ha ụnyaahụ nke mere na ọkụ bịara n'ọtụtụ ebe na Naịjirịa.
Tony Oneweek bịara na BBC Igbo
Dịka ọnwa Disemba siri che mmadụ niile n'ihu, BBC Igbo chukwitere onye tiri egwu ahụ wuru ewu.
Lee ihe anyị na ya kpakọrịtara n'ehihie Fraịde.