You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Nigerian Celebrities: Lekwa ihe mere ka ndị a ama ama wuo n'ízu a
Dịka izuụka a na-abịa n'isi njedebe, anyị na-ewetara gị ihe ndị ama ama ụfọdụ mere nke dara ụda.
DAVIDO
Obi bụ Davido sọ anụri dịka enyị ya nwaanyị, Chioma mụrụ nwaa nwoke na Sụnde gara aga.
Kama ndị osochiegbu bịara ime ya obi ọjọọ mgbe ha boro ya ebubo na ọ tụwara otu n'ime ha ime.
Ụmụagbọghọ a mechara kwugharịa si na ha na-ama ya njakịrị.
Ha rịọkwara Davido ka ọ gbaghara ha na ọ bụ egwuregwu.
Kama Davido sị 'Njakịri laa azụ' ha ka atakwute ya kọnkịrị n'ụlọ mkpọrọ.
Okey Bakassi
I mara afọ ole Okey Bakkassi dị?
Otụtụ amaghị mana nwoke a agbaala afọ iri ise.
Bakassi mezuru ya afọ iri ise ọnọọrola n'elụ uwa n'ụbọchi Wenesde gara aga.
Lekwa ụfọdụ ozi ekele ezitere ya.
Meghan Markle,'Duchess of Sussex'
Harry na Meghan bụ aha nọ ọtụtụ ndị mmadụ n'ọnụ n'izu a.
Ha abụọ bụ Duke na Duchess nke obodo Sussex dị na mba Ịmgland.
Ụfọdụ kwuru nke di mma ebe ụfọdụ kwuru njọ maka ha.
Mana Meghan akatọọla etu ndị ntaakụkọ si ebu akụkọ maka ndụ ya na ezinụlo ya.
Lee ihe ndị mmadụ nwere ikwu maka ya -
KANYE WEST
Kanye West wuru na Sọshal Midịa maka egwu ọhụrụ o tipụtara, ọkachasị nke ọkpọrọ 'Jesus is Lord'.
Lee ihe ndị mmadụ kwuru maka ya.
FRODD
Frodd onye ezigbo aha ya bụ Chukwuemeka Okoye gọsipụtara obi mwute o nwere dịka ọ gara leta ndị Onịcha ọkụ tanka gbara metụtara.
Lee ihe ekwuru maka njem ya na Twitter
CHIZZY ALICHI
Nwaada a makarịrị 'mamiwọta' na mma biara nọnyere BBC Igbo n'ụbọchị Fraịde.
O sonyere n'ihe omume anyị a kpọrọ 'Gịnị na-afịọ'.
Lee ka o siri gaa.
Akụko ga-amasi gị
Ihe nkiri ga-amasi gị: