You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Davido ọ kụọla aka n'ụzọ ọyị ya nwaanyị o bunyere ụgbọala naira 45 million?
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1
Ụmụ Naịjirịa etinyela ọnụ gbasara akụkọ na Davido na-akwado ilụ Chioma Rowland, ọyị ya nwaanyị.
Nke a na-eme ka Davido wepụtachara foto gosiri mgbe ya ndị be Chioma nọ n'elu Instagram wee dee "First of all introduction".
Nwanne Davido bụ Adewale Adeleke tinyekwara ọnụ n'okwu a.
Ndị ọyị ya ndị ọzọ nakwa ndị nso nso ya kwuru ọtụtụ ihe maka ya bụ ndepụta.
Etu ọ dị ugbua, amabeghị mgbe ya bụ alụm dị na nwunye ga-eme mana etu Davido depụtara maka ịkụ aka n'ụzọ o mere na-eme ka ndị mmadụ na-akwado maka igba nkwụ ha.
Ha bakwara ya aha dịka #CHIVIDO2020.