Xenophobia in South Africa: Gọọmenti etiti akpọọla onye nnọchiteanya ndị South Africa na Nigeria

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Mịnịsta na-ahụ maka ihe gbasara maka mmekọrịta ụmụ Naịjirịa na ndị mba ọzọ bụ Geoffrey Onyeama ga-ezute onye na-anọchite anya ndị South Afịrịka na Naịjiria bụ Bobby Moroe.

Nzụkọ ha ga-enwe metụtara mwakpo mere na mba South Afịrịka nso nso a kamgbe izu ụka gara aga.

Cheta na Onyeama depụtara n'akara twitter ya na ozuola maka mwakpo Souh Afịrịka na-emeso ndị Naịjirịa bi na mba ahụ.

Ọtụtụ ụmụ Naịjirịa tinyekwara ọnụ na ya bụ okwu.

Anya anyị ka dị na akụkọ a ,anyị ga-agba mbọ wetere gị ka o si aga dịka ọ na-eru anyị ntị.

Ọtụtụ ndị ọnụ na-eru n'okwu amanyela ọnụ n'ọgbaghara ọhụrụ nke ịkpaoke agbụrụ na-eme na Saụt Afrịka.

Onye dịka Abike Dabiri-Erewa bụ onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka ihe gbasara ndị Naịjirịa bi na mba ofesi depụtara ozi ọhụrụ n'akara twitter ya.

O kwuru na ọ ga-adị mma ka ngalaba na-ahụ maka ihe gbasara mba ofesi na Naịjirịa kwee ka gọọmenti etiti nakwa ndị niile onye nke ha nwụrụ n'ọgbaghara ịkpaoke agbụrụ gaa n'ụlọikpe Africa na-ahụ maka nke ikike ruru onye.

Onye zọburu oche onyeisiala na ntuliaka 2019 bụ Kingsley Moghalu kwuru na oge eruola mgbe Naịjirịa ga-eji kwụghachị ndị Saụt Afrịka ụgwọ maka agwa ịkpaoke agbụrụ ha na-akpaso ha.

@AbangMercy na-rịọ ka ụmụ Naịjirịa kwụsị ị na-aga mba Saụt Afrịka maka ihe mere ya mgbe ọ gara ebe ahụ n'afọ 2013.

@cbngov_akin1 na-akatọ okwu osote onyeisi ndị uweojii na Saụt Afrịka

Ọtụtụ ndị ọzọ nọọkwa n'elu twitter na-ekwusi ike ka gọọmenti Naịjirịa ghara ịgba nkịtị maka ọgbaghara ọhụrụ ikpaoke agbụrụ megide ndị Naịjịrịa dapụtara na South Africa.

Ikechukwu Samson bụ onye Naịjirịa bi na mba Saụt Afrịka ekwuola na ihe ha ji anya ha ahụ na mba ahụ abụghị ihe ga-eme ka ha gbaa ọsọ.

Samson gwara BBC Igbo na mwakpo ndị Saụt Afrịka na-eme rutere ndị mba ọzọ, mana ọ bụ ndị Naịjirịa ka ọ kacha metụta.

O kwuru na ndị omekome a gara ebe ndị na-ere ihe dịka ụgbọala na ebe a na-arụzi ụgbọala, na-esunye ha ọkụ; o kwukwara na ha agbaala ihe karịrị ụgbọala 25 ọkụ.

O kwuru na ha enweghi ike ịkọwa ihe bụ isi esemokwu a, mana ihe kacha ewute ha bụ ihe ndị mmadụ e mebichara.

O kwukwara na o nweghi ike ịkọwa ma e nwere onye nwụrụ na mwakpo a, maka na ọtụtụ foto na ihe nkiri na-efegharị na soshal midia edochaghị anya mgbe o mere.

Samson kwuru na ka o sila dị, na ha na-eke nkwụcha wee na-eze onwe ha na ezinaụlọ ha.

Gọọmentị etiti etinyela ọnụ

Minista na-ahụ maka mmekọ Naịjirịa na mba ofesi bụ Geoffrey Onyeama sị na ha agaghi agba nkịtị na-ekiri ka a na-awakpo ndi Naịjiria bi na Sawụt Afịrịka.

O kwuru nke a ka akukọ na-apụta maka mwakpo a na-eme ndị mbịarambịa na ya bụ mba.

Maazị Onyeama sị na ike agwụla Naịjirịa etụ e si agba ụlọahịa na akụnaụba ndị Naịjirịa ọkụ dịka ndị uweojii adịghị echekwa ha etụ o si kwesi.

N'ụbọchị mbụ nke ọnwa Septemba, narị kwuru narị ndị mmadụ malitere mwakpo ndị mbịarambịa ma na-ezu akụnaụba ha nke ha agbaghị ọkụ.

Ihe a mere n'ebe dị iche iche na obodo Johannesburg.

Ụlọ ntaakụkọ a kpọrọ "News Agency of Nigeria" dere na mmadụ atọ nwụrụ n'ime mwakpo a.

Ka ọ kwụ ugbua, ndị uweojii na Sawụt Afrịka anwụchịela mmadụ 43 ha sị na aka ha dị na ya bụ mkpa mkpa.

Ndị uweojii gbara anwụrụ anya mmiri na mgbo egbe nke rọba nakwa akụrụmgwa ndị ọzọ iji wụọ mmiri oyi n'ọgbaghara a.

Amabeghị onye malitere mkpa mkpa mana ụdịrị akụkọ a abụghị ihe nti anubeghi na Sawụt Afịrịka.

Ihe onyonyo dị na Twitter gosiri igwe mmadụ na-achọ ndị mbịarambịa ha ga-ememina.

Akụkọ ga-amasị gị: