You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Xenophobia: South Africa abaala mba maka mkpagbu ndị ọbịa be ha
Minista na-ahụ maka mmekọ mba Sawụt Afrịka na mba ndị ọzọ akpọọla nzụkọ gbatagbata na be ha.
Lindiwe Sisulu na ndị na-anọchite anya mba ndị ọzọ na Sawụt Afrịka ga-enwe nzụkọ iji chọpụta ihe a ga-eme maka ogbugbu na mwakpo ndị mmadụ.
Akụkọ kwuru na ọgbaghara malitere kemgbe abalị ụbọchị ụka n'izu gara aga ebe ndị mba Sawụt Afrịka bidoro ịwakpo ndị ọbịa
Ogbaghara a ataala isi mmadụ atọ kemgbe o bidoro.
Sisulu agwaala ndị ọrụ nchekwa na rụọ ọrụ ncheklwa ha na-enghi onye ọbụla anya n'ihu.
"Anyị agaghị agba nkịtị a na-akpagbu ndị mbịara mbịara ebe a" ka o kwuru.
Dịka ọ dị ugbua ndị mbiarambiara dị icheiche nọ n'ụlọọrụ ndị uweojii ebe ha na-ezo onwe ha dịka achụpụchara ha na bee ha.