Hurricane Dorian: Oke ifufe eburula ụlọ 13,000 na Bahamas

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Akụkọ dị mkpa:

Bahamas nọ na nsogbu

Oke ifufe a kpọrọ Hurricane Dorian, ebutela oke idemmiri na mba Bahamas.

Mana ka ọ dị ugbua, amabeghi mmadụ ole o gburula maọbụ merụọ ahụ, mana ndị ọrụ gbatagbata Red Cross na-ekwu na ọ dị ka ọ metụtara ụlọ ruru puku iri na atọ.

Mara na ndị mmadụ bụ ndị mba ahụ dị puku narị atọ na iri itoolu na otu (391,000).

Nke ka nke bụkwa na oke ifufe a echewela ihu na mba Amerịka, ebe ndị obodo dịka Flọrịda, Giọgia, Nọt na Saụt Karolaịna, nọzị n'ọnọdụ 'gbata ọsọ bịa nyere anyị aka".

Gọomentị etiti etinyela ọnụ na mwakpo ndị Naịjirịa

Geoffery Onyeama bụ minista na-ahụ maka mmekọrịta mba na mba, ekwuola na gọọmentị Naịjirịa ga-ama ihe ha mere maka mwakpo ndị Naịjirịa na mba Saụt Afrịka.

Nke a na-abịa dịka ụfọdụ ndị mba ahụ zuru ohi ma gbaa ụlọahịa ụfọdụ ndị Naịjirịa na ndị mba ọzọ nwe, ọkụ.

Ọnọdụ ọdọụgbọelu Akanu Ibiam dị n'Enugwu

Ọrụ amalitebeghi n'ọdọụgbọelu Akanu Ibiam dị n'Enugu steeti, n'agbanyeghi na ọ bụ maka ịrụ ya ọrụ ka gọọmentị ji mechie ya.

Gụọ maka ọnọdụ ọ nọ ugbua, ebe a: Lee ọnọdụ ọdọụgbọelu Akanu Ibiam dị n'Enugu steeti

Mmechi ahịa ọzụzụ na orire na Yurop

Dịka ahịa ọzụzụ na orire nke Serie A, La Liga, Bundesliga nakwa Ligue 1 na-emechi taa, ụfọdụ ka na-eche ịma ebe ndị bọọlụ na-amasị ha ga-agafe.

Ka ọ dị ugbua, Henrikh Mkhitaryan nke Arsenal agafeela Roma dị n'Italy na mbite.

O nweghi ihe ọjọọ dị n'ịzụrụ anyị ụgbọala n'ụzọ iwu kwadoro - Ndị Sinetọ

Otu dị iche iche gụnyere SERAP, BudgIT na Enough is Enough akpụpụla ndị Sineti n'ụlọikpe maka ego dị ijeri naịra ise na ụma ha chọrọ iji azụrụ onwe ha ụgbọala.

Ha kwuru na nke a megidere iyi ndị ụlọomeiwu ṅụrụ ime ka ndụ dịrị ụmụ Naịjirịa mfe dịka ha a-ewere ọkwa ọchịchị

Mana ọnụ na-ekwuru ndị Sineti bụ Sinetọ Dayo Adeyeye sị na ntị ya anụbeghi ihe ọbụla banyere ịjị ụdị ego ahụ azụ ụgbọala.

N'ajụjụ ndị ntaakụkọ Channels TV jụrụ ya, Adeyeye kwuru na ọ bụrụ na amapụtara ego ahụ na mkpata na mmefu, na onweghi ihe ọjọọ dị na ya.

Ọdọ ụgbọelu Asaba ga-abụ nke ụwa niile:

Mịnịsta na-ahụ maka ụgbọelu bụ Hadi Sirika ekwuola na ọdọ ụgbọelu dị n'Asaba, Delta Steeti adịla njikere ịbụ nke e ji efega mbaụwa niile.

Sirika gwara ndị ntaakụkọ nke a ụnyaahụ dịka o na enyocha ngwaọrụ ọhụrụ dị iche iche dị n'ọdọ ụgbọelu ahụ.

N'ofesi

Nwafọ mba Amerịka a ma ama n'ịkpaọchị bụ Kelvin Hart na mmadụ abụọ ndị ọzọ nwere ihe mberede okporoụzọ n'isi ụtụtụ Sọnde.

Agbanyeghi na onweghi onye nwụrụ n'ime ha Kelvin Hart na otu onye ọzọ nwere ezigbo mmerụ ahụ n'azụ ha.

N'egwuregwu

Onye bụ ọkaibe n'ịkụ Tennis bụ Novak Djokovic ewezugala onwe ya n'ịkụ Tennis US Open nke ya na Stan Wawrinka n'ihi mmerụ ahụ.

Djokovic nwetere mmerụ ahụ n'ubu ya n'ime nkeji ole na ole ha malitere asọmpi ahụ.

Nkeji