You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Cyclone Idai: Lee etu ajọ ifufe mmiri siri mee ndị obodo a ịwa
Okeifufe mebiri ọtụtụ ihe
Onyeisiala mba Mozambik bụ Filipe Nyusi, kwuru na mmadụ ruru otu puku anwụọla n'oke ajọ ifufe mmiri dakwasịrị obodo ahụ.
O kwukwara na mgbe ọ gara nyochaa, o ji anya ya hụ ozu ndị sere n'elu n'ime mmiri ahụ.
Ajọ ifufe mmiri ahụ nke bekee kpọrọ 'Cyclone Idai' malitere ịkpa ike kemgbe ụbọchị tọzde izu gara aga bụ Maachị 14.
Mana ọ bụ n'ụbọchị ụka ka enyemaka ruru ndị mmadụ aka.
'Cyclone Idai' metụtakwara mba agbatobi Mozambik gụnyere Zimbabwe nakwa Malawi.
Lee ihe ndị o metụtara
Gọọmentị Zimbabwe kwuru na mmadụ karịrị narị abụọ nwụrụ n'ọdachi a.
Otu onye ọrụ UN bụ Gerald Bourke kwuru na gbamgbam ọtụtụ ụlọ dara ada nke mere na ndị mmadụ enweghizi ebe obibi.
Ọtụtụ ihe dịka ụzọ nakwa ụgbọala mebiri n'ihe ọdachi ahụ mere.
Ndị nwụrụ n'ihe ọdachi a gụnyere ụmụakwụkwọ abụọ mgbe okwute si n'elu ugwu dakwasịrị ụlọ obibi ha n'ime ụlọakwụkwọ.
Foto nakwa eserese ndị ọzọ si ebe ahụ apụta na-egosi ndị ka rigoro n'elu ụlọ ha na-eche enyemaka.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị