Election tribunal: Kagbuonu ntuliaka ọkwa onyeisala - Atiku

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Otu PDP nakwa onye zọrọ ọkwa onyeisiala n'okpuru ha bụ Atiku Abubakar agaala ụlọikpe iji zọọ ọkwa nke ha kwenyere na ha meriri.

Ha gwara ụlọikpe pụrụiche gbasara ntuliaka ọkwa onyeisiala n'Abuja sị ha kagbuo ma megharịa ntuliaka nke ọkwa onyeisiala e mere n'ụbọchị iri abụọ na atọ nke ọnwa Febụwarị.

O ji ndị ọkaiwu ukwu ruru iri abụọ na ndị akaebe karịrị narị anọ awụchi n'ụlọikpe.

Dịka ọ dị ugbua ụlọikpe enyebeghi ha nzaghachị ma ọ bụ hiwe ụbọchị ikpe a ga-amalite.

Ike agwụla m ịchị unu!

Nke a bụ ọnọdụ onyeisiala mba Kazakhstan bụ Nursultan Nazarbayev nọ ugbua, ka ọ na-ekwuputa na ọ ga-akwụsị ịchị mba ahụ ka ọ chịchara ha afọ iri atọ.

Nazarbayev dị afọ 78 kwuru na Kassym-Jomart Tokayev, bụ onyeisi ụlọomeiwu ha, ga na-arụ ọrụ dịka onyeisiala ruo mgbe oge ọchịchị ya ga-agwụ n'ọnwa Epreelụ 2020.

N'egwuregwu,

Eze otiti n'otu Super Falcons bụ Asisat Oshoala, ekwuola na ihe ka ya mkpa ugbua bụ ịhụ na ọ gbakere ọfụma ma lọghachịta n'egwu ọ hụrụ n'anya.

O kwuru nke a maka akwara ọ dọrọ oge ya na ndị otu Barcelona ya na ndị Atletico Madrid zutere ụbọchị ụka.

Ndị agha azaghachila Inec

Ndị agha Naịjirịa ekwuola na ọ bụ ihe ịtụrụ ha n'anya banyere ebubo Inec boro ha na ha so mebie ntuliaka ọkwa gọvanọ e mere na Rivas steeti.

N'ime akụkwọ ozi ha biputara, ha kwukwara na obi adịghị ha mma gbasara ebubo a n'agbanyeghi mbọ niile ha gbara iji nye Inec aka na ntuliaka ahụ.

N'ofesi,

Ndị uweojii anwụchiela otu nwoke gbagburu mmadụ atọ ma merụọ mmadụ ise ndị ọzọ ahụ n'obodo Utrecht nke mba Netherlands.

Amambeghi ihe ọ bụ n'uche mana e chere na Gokmen Tanis na ndị oyi ndụ egwu na-arụkọ ọrụ.

N'egwuregwu,

Otu bọọlụ Naịjirịa ndị obere ga-ebido ọzụzụ ha na mba Tunisia taa dịka ha na akwado ịzute mba Libya iji mara onye tozuru asọmpị iko mba Afrịka nke obere.

Nkeji

Ihe nkiri