You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Buhari in Japan: Kedụ nke bụ eziokwu banyere ọnọdụ njem Buhari na Japan?
Dịka onye ndu otu Indigenous Peoples of Biafra (Ipob) bụ Nnamdi Kanu na-ama aka maka ọnọdụ Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buahri na mba Japan, ọ gụpụtara ndị ntaakụkọ ọ si "na-ekwu okwu asị".
Kanu kpọrọ Channels TV, NTA na Legit.com bu ndị akụkọ ụgha, ma gakwa n'ihu sị na "BBC Igbo esorola ha."
N'ọnụ Kanụ ihe ụlọ ntaakụkọ mere bụ ịgbasa ozi na Onyeisiala Buhari nọ na Japan maka atụmatụ nzụkọ mba ahụ na mba Afrịka akpọrọ "Seventh Tokyo International Conference on African Development" (TICAD7) n'obodo Yokohama dị na Japan.
Cheta na Maazị Kanu nyere ndi Ipob iwu ka ha nwụchịe Onyeisiala Buhari bụ onye ha sị na ọ bụ onye mba Sudan ha kpọrọ "Jubril".
Kanu sịkwa na foto na ihe onyonyo ndị ntaakụkọ na-ewepụta bụ nke adịgboroja e ji teknụzụ "Photoshop" mepụta.
Nnyocha BBC egosibeghị na- eji "Photoshop" mepụta ihe onyonyo maọbụ foto si nzụkọ ahụ na Japan.
Foto si nzụkọ ahụ gunyere nke si akara gọọmentị Japan dịka nke ha tinyere na soshial midia ha nke gosiri onyeisiala ha bụ Sihinzo Abe ka ọ nọ na ya bụ nzụkọ.
Foto ndị a gosikwara Onyeisiala Buhari na aka na-achi mba Afrịka ndị ọzọ ka ha na Onyeisiala Abe na-achịkọrịta ọchị.
Ụlọ ntaakụko 'Ruptly' wepụtakwara ihe onyonyo gosiri mgbe Abe pụtara ise ya bụ foto. Onyeisiala Buhari na ndị ọzọ pụtara na ha bu ihe onyonyo.
Onyeisi ụlọakụ maka mmepe Afrika a kpọrọ African Development Bank na Bekee bụ Akinwumi Adeshina wepụtakwara foto ya na Buhari sere na Japan.
Ihe ọzọ nwekwara ike suo kpọm n'okwu na ndị ntaakụkọ adịghị atụ asị banyere ọnọdụ njem Buhari na Japan bụ foto a ebe ya na abe zutere n'ụbọchị nke iri abụọ na itoolu nke ọnwa Ọgọstụ.
Agbanyeghị na ihe niile na-egosi na Buhari no na Japan, Ipob na Kanu ka na-asị na ọ bụghị eziokwu, ma kwuo na na ha na-esi imi n'ala achọgharịi ya na Japan.
Kanu onye kwuru nke a n'ozi ọ gbasara na Facebook n'abalị Wenezde, kwuru na "Ọ bụrụ na ọ na na Japan, ya pụta bịa fere ndị mmadụ aka."
"Anyị chọrọ ijide ya ka anyị mee ya nnyocha 'DNA' iji mara onye ọ bụ n'ezie."
Kanu tụrụ ọnụ na-ekwuru Buhari bụ Femi Adesina aka ebubo ikesa 'foto adigboroja' maka Buhari ịnọ na Japan.
"Foto na vidio e sere maka Buhari ịnọ na Japan bụ akpụrụ akpụ."
Maka BBC Igbo, Kanu sị: "Ha (BBC Igbo) na-amaga ka ha bụ ndị anaghị ele mmadụ anya n'ihu mana ọ bụ asị."
Lee akuko ga-amasị gị