Buhari in Japan: Ipob emeghi 'pịm' ka Buhari wuchiri Japan

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Ndị isiala Naịjirịa ekwuola na o nweghi ihe jikọrọ ndị Ipob na njem onyeisiala Naịjirịa ka o wuchiri na Yokohama na mba Japan, n'ụbọchị Monde.

Femi Adesina bụ onye ndụmọdụ puruiche gbasara mgbasa ozi nke onyeisiala Buhari gwara ndị Naịjirịa ka ha gba ndị Ipob nkịtị maka ihe onyoonyo ụgha ebe ha gosiri ebe ha na-awakpo onyeisiala Naịjirịa.

Dịka edemede Femi Adesina si kwuo na "akụkọ ụgha a bụ aka ọrụ ndị kpọrọ mmadụ asị na-amaghị na ndị Naịjirịa ahapụla ha kamgbe".

Onyeisiala Naịjirịa bụ Buhari gara Japan iji sonye na nzụkọ 'International Conference on African Development' nke asaa a na-akpọ TICAD7 n'chafụ.

Nzụkọ a na-eme na Tokyo.

Femi Adesina kwuru na nzukọ a ga-ebido n'ụbọchị 28 ruo 30 n'ọnwa Ọgọst, 2019, nke isiokwu ya ga-abụ "Afrịka na Yokohama, nkekọrịta mmasị ọdịnihu"

Cheta na nke a ga-abụ nzukọ nke abụọ onyeisiala Naịjirịa ga-eso mee, dịka o sonyere na nke e mere n'afọ 2016 na mba Kenya.

Ọ sịkwa na olileanya ha bụ na nzukọ a ga-ebutere Naịjirịa ụlọọrụ ndị na-etinye ego n'azụmahịa.

Otu egwuregwu ụmụnwaanyị na-erubeghi afọ iri abụọ (U-20) ejirila goolu gbajuo Ọljiria afọ

Otu egwuregwu ụmụnwaanyị Naịjiria ndị na-erubeghi afọ iri abụọ (U-20) ejirila goolu gbajuo Ọljiria afọ.

Otu a akpọrọ Falconets, ji goolu atọ a na-asataghị ma otu merie n'asọmpi African Games a na-eme na mba Moroko.

Nke a bụ mbụ otu egwu bọọlụ Naịjirịa na-eru agba ngwụcha n'asọmpi a kemgbe 2007.

Kaduna steeti ga-amalite ịkwụ ụgwọ opekatampe

Gọọmentị Kaduna steeti ekwuola na ha ga-amalite ịkwụ ndị ọrụ ụgwọ opekatampe puku iri atọ (N30,000) site n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Septemba, 2019.

Muyiwa Adekeye bụ onye ndụmọdụ pụrụiche n'ihe gbasara mgbasaozi na nrụrịtaụka nye Gọvanọ Nasir el-Rufai, kwuru nke a ka e mechara nzukọ ndị ọchịchị steeti ahụ, nke osote Gọvanọ Hadiza Balarabe nọ n'isi ya.

O kwuru na ha kwekọrịtara ịkwụ ụgwọ opekatampe ọhụrụ a nakwa ụgwọ ndị ọzọ nye ndị ọrụ Bekee site n'ọnwa Septemba.

Anyị akụtughi ụlọalakụba - Wike

Aka na-achị Rivas steeti bụ Nyesom Wike, agọrọla ụkwụ na aka ya n'ebubo na gọọmentị kuturu otu ụlọalakụba na steeti ahụ.

Ọ gwara ndị ntaakụkọ na gọomentị enyebuola iwu ka a ghara ịrụ ụlọ n'ala ahụ, mana ndị na-arụ ụlọ ahụ kpụpụrụ gọọmentị ụlọikpe, ebe gọọmentị nọ merie ikpe ahụ.

O kwuru sị "Ọ dị egwu na ndị mmadụ ga-eche na a rụrụ ụlọalakụba, gọomentị agaa kwatuo ya".

Ọ gara n'ihu kwuo na onye sị na ọ bụ asị, na ndị alakụba pụta bịa tụọ aka ebe ha rụrụ ụlọekpere ha sị na gọọmentị kwaturu.

Interpol ọ ga-enyere Naịjiria aka?

Onyeisi ndị uweojii Naịjirịa akpọkuola ndị Interpol bụ ndị uweojii mba ụwa niile, ka ha gbatara ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa ọsọ enyemaka iji chọpụta ụzọ e si ebubata ngwa agha iwu machiri.

N'ofesi,

Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump, ekwuola na mba ha na China ga-amalitekwa nkata ha gbasara azụmahịa ọzọ.

Cheta na Trump kwuburu na ọ ga-agwa ụlọorụ ndị Amerịka nọ na mba China ka ha kwakọrọ ihe ha lọghachite, n'izu gara aga, dịka China kwuru na ha ga-etinyekwu ego n'ihe ndị Amerịka na-arụpụta na mba ha.

Gịnị na-afịọ n'Imo steeti?

Gọọmentị Imo Steeti ekwuola na ha agaghị egbochi nnyocha ndị nchekwa nzuzo nke mba Amerịka na-eme gbasara mpụ ịntanetị nke ụfọdụ ụmụ Naijiria mere n'obodo ahụ.

Nke a na-abịa dịka a chọpụtara na otu onye n'ime ndị a na-ebo ebubo iso na mpụ a bụ Chika Odionyenma, rụbuuru Emeka Ihedioha ọrụ.

Gọọmenti agaghị egbochi mba obụla ihibe iwu ha

Ọnụ na-ekwuchitere onyeisiala Naijịrịa bụ Garba Shehu, ekwuola na gọomentị etiti dị njikere iwepụta iwu ga-amachi ụzọ niile ụfodụ ndị ji ebutere Naịjirịa aha ọjọọ n'ofesi.

O kwuru nke a mgbe a gbara ya ajụjụ ọnụ maka ụmụ Naịjirịa e ji eji na mba Amerịka gbasara iji ụzọ aghụghọ anapụ ndị mmadụ ego site n'Intanetị.

Shehu kwuru na gọomentị na ụlọomeiwu ga-asa anya na mmiri were nyoputa mperi niile dị n'iwu Naijiria nke ndị omekome ji eme mpụ.

NLC anabataghị atụmatụ gọmentị maka ibuligwọ ọk latrik.

Otu jikọrọ ndị ọrụ Naịjirịa bụ Nigerian labour Congress (NLC) akagbuola atụmatụ gọọmentị ibuli ego ọkụ Latrik.

Odeakwụkwọ NLC bụ Emmanuel Ugboaja, kwuru nke a mgbe ya na ndị ntaakụkọ nwere mkparịtaụka ma kwukwa na atụmatụ gọọmentị ire oke ha n'ụlọọrụ na-ekesa ọkụ latrik, tiri aka na tipper bu aja ebe NLC nọ.

Idemmiri na-eme wa na mba Sudan

Idemmiri eriela isi mmadụ iri isii na abụọ na mba Sudan dịka ha banyere udu mmiri kemgbe ọnwa Julaị.

Ndị gbatagbata nke United Nations kwuru na idemmiri a emebiela ụlọ puku iri atọ na asaa ma kwuokwa na ha na-atụ anya na mmiri ọzọ ka na-abịa.

Ndị United Nations na-ekwukwa na mmiri a ga-ezogide ruo ọnwa Ọktoba.

Goolu mb na asọmpi nke mbụ

Nwaafọ Naijiria bụ Moses Simon na-agbara ndị otu egwuregwu bọọlụ FC Nantes nke mba Frans sị na obi dị ya ụtọ dịka o nyere goolu ndị otu ya ji merie n'asọmpi nke mbụ ya.

Simon dị afọ iri abụọ na ise batara na nkeji iri asaa na isii ma nye goolu ndị otu egwuregwu ya ji merie otu egwu bọọlụ Amiens SC.

Akụko ga-amasị gị :

Gee Nkeji Akụkọ nke ụtụtu a:

Lee ihe nkiri ga-amasị gị: