You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
FBI list: Nwụchi ụmụ Naịjirịa 77 na mba Amerịka na-echekasị anyị
N'ime akwụkwọ ozi nke ụlọọrụ Nigerians in Diaspora Commission bụ NDiC depụtara, ha gosiri ebumnuche ha.
Ha kwuru na akụkọ ahụ na mba Amerịka nwụchiri mmadụ 77 maka mpụ ego na-echekasị ha obi.
Abike Dabiri bụ onyeisi ụlọọrụ ahụ kwuru na nwuchi mmadụ apụtaghị na ikpe mara onye ahụ.
"Anyị na-akpọ ndị e boro ebubo nọ Naịjirịa oku ka ha nyefe onwe ha n'aka ndị uweojii mba Amerịka" ka ha kwuru.
Na ngwụcha ha kwuru na agwa ụfọdụ ụmụ Naịjirịa egosighi agwa mmadụ niile nọ na mba ahụ.
Ngalaba na-ahụ maka ikpe nkwụmọtọ na mba Amerịka arụọla ụmụ Igbo ruru 70 ebubo mpụ ego.
Ọ bụ ụnyaahụ ka otu ndị na-ahụ maka nchekwa na mba Amerịka pụtara ịgbasa ozi ka ya bụ akụkọ pụtara ihe.
Ha kọwara etu ha sị malite nyocha nwụchiri ndị a n'afọ 2016 ma kwuo na nyocha ka na-aga ihu.
N'ọnụ ha "anyị na-eme ihe a iji chekwa azụmahịa dị icheiche na mba Amerịka n'aka ndị na-eme mpụ ego na intaneti"
Mmadụ abụọ a kpọrọ aha bụ Valentine Iro na Chukwudi Igbokwe bụ isi sekpụ ntị n'akụkọ mpụu a.
Ha kwuru na anwụchiri mmadụ iri na otu ọzọ ebe abụọ nọ na mkpọrọ mbụ gbasara okwu a.
Ngalaba ahụ gwara ndị nọ n'azụmahịa hie asaa n'anya gbasara ịchekwa onwe ha n'azụmahịa intaneti.