MMM re-launch: Onye ọ bụla jiri ire ya gụọ eze ya ọnụ - EFCC

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ọnụ na-ekwuru ụlọọrụ Economic and Financial Crimes Commision(EFCC) dị n'Enugu bụ Chris Oluka ekwuola na MMM bụ ajọ ihe ma na-arịọ ụmụ Naịjirịa ka ha gbara atụmaatụ a ọsọ.

Oluka kwuru ka ụmụ Naịjirịa jiri ire ha gụọ eze ọnụ gbasara ya bụ atụmaatụ.

Gere ihe okwuru n'uju n'ihe ọkpụkpọ.

"Ihe MMM mere m"

Onye na-achọghị ka akpọpụta aha ya gwara BBC na o tufuru ego ruru nde naira ise na ụma, kwuru na MMM agaghị eme ọfụma dịka ndị nwe ya malitere ya ọzọ.

O kwuru na ọ ga-echefu ego niile o tufuru tupu MMM emechie na mbụ gbara ya bụ atụmaatụ ọsọ.

O kwuru na dịka onye gbagotere n'ọkwa mgbe mbụ MMM pụtara, na ọ ga-adụ ụmụ Naịjirịa ọdụ ha abanyekwala atụmaatụ a ọzọ.

"M ka ga-eme MMM ọzo"

Mana onye ọzọ ji ego o ritere na MMM ruru nde atọ wee zụta ala kwuru na ya ga-abanye ọzọ.

O kwuru na ọ bụ akọ na uche ka eji abanye MMM makana a ga-enwerịrị ndị ọ ga-akwa na ndị ga-erite uru na ya bụ atụmaatụ.

Kamgbe ụlọọrụ MMM depụtachara n'akara webụsaiti ha na ha malitela ọzọ, lekwa ihe ndị mmadụ na-ekwu n'elu soshal media.

@EmyOputa kwuru na ọ bụrugodi na ha apụtara ọzọ n'ezie, na ya agaghị etinye aka ebe ahụ ọzọ.

@Ojjobalo kwuru na ọchị na-atọ ya makana ndị mmadụ amụrụla akọ

Mana ‏@am_daboss kwuru MMM abiala ịnọdụ.

@aliyyzacs kwuru ka gọọmenti etiti nyocha ha ọfụma.

@Da1aniekan kwuru na ọ gaghị abanye ọzọ ma ncha ma ncha.

@VICKNNADI1 na-arịọ ụmụ Naịjirịa ha ekwela ka a rafuo ha ọzọ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: