You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Burna boy: Ihe nne ya kwuru kopuru ụwa
Ihe nrite eji asị ndị bụ ọkaibe n'ejije, egwuregwu nakwa n'ihe mkpalite mmụọ dị iche iche akpọrọ BETAwards na beekee kpọtụrụ a kpọtụ ụnyaahụ na mba Amerịka.
Otiegwu ama ama dịka Burna Boy so na ndị nwetere ihe nrite na BETAwards nke 2019.
E nyere ya ihe nrite dịka ọkaibe n'iti egwu na mba ofesi.
Teni bụkwa onye Naịjirịa sokwa na ndị akpọpụtara aha dịka ndị a ga-ama onye bụ ọkaibe n'etiti ha n'iti egwu ọhụrụ na mba ofesi mana o riteghị ya.
Ihe kopuru ụmụ Naịjirịa na mmemme ahụ bụ okwu nnabata ihe nrite nne Burna Boy kwuru mgbe e nyechara nwa ya nturuugo.
O kwuru, "nwa m Burna si m gwa unu na onye isi oji ọbụla bụgodi onye Afrịka tupu ọ bụrụ ihe ọzọ ọbụla."
Nke a mere ka ụmụ Naịjirịa kwuputewe ọtụtụ ihe n'elu soshal midia.
@mrrsmartt kwuru na ọ bụ oge Burna ịchake, na ya jisike.
@jockfreshprince sepụtara okwu ahụ mama Burna kwuru ma na-eto ya.
@Kozidrizzy1 si na ya obi bụ ya sọ ụtọ maka ihe nrite Burna Boy
@walegates na-etokwa Burna Boy.
Ndị nso nso Burna na-eto akwa o yi bia ya bụ mmemme.
Cheta na Tiwa Savage , Davido, Ice Prince, Wizkid, Sarkodie, Tuface Idibia nakwa Dbanj eritela nturuugo BET Awards.