You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Burna Boy: Gịnị gbasara Coachella na ụmụ Naịjirịa?
Emume ịgụ egwu nke mba Amerịka a kpọrọ 'Coachella Valley Music and Arts Festival' na-eme n'ọkpa Colorado bu otu emume dị ukwu.
N'ime nke afọ a, ndị otiegwu Naịjirịa abụọ bụ Burna Boy nakwa Mr. Eazi ga-esonye na ndị ga-agụ egwu na ya bụ emume.
Ihe a mere na ụfọdụ ndị mmadụ na-egosi ọṅụ ha gbasara ya bụ okwu.
JAGS kwuru na ha abụọ bụ ndị Naịjirịa gara ya bụ emume.
Tema_JayZ kwuru na ọ bụ ihe ọma mere Afrịka niile.
Gịnị butere eseomkwu dị n'ime ya?
Burna boy bụ otu n'ime ndị otiegwu ahụ bụ Burna Boy nọ na mmiriọkụ ugbua dịika ndị mmadụ na-akatọ ya maka okwu okwuru.
Ọ gwara ndị coachella na mkpụrụ edemede ejiri depụta aha ya na foto mgbasa ozi ha pere mpe ma sịkwa ha ha gbaa mbọ lebanye anya na ya.
SulAF jiri foto Mourinho gosi uche ya gbasara ya bụ okwu.
Ebe Timi kwuru na onweghị ihe ọjọọ ọ hụrụ Burna Boy mere maka okwu ya
Ụfọdụ mmadụ jiri aka ha dere Burna Boy aha ya n'akara edemede ukwu
Rue ugbua Coachella asabeghị Burna Boy okwu maọbụ gbanwee akara ha jiri dee aha ya na foto mgbasa ozi ha.