2018 Highlights: Ihe iribama metụtara ndị Igbo n'afọ a

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ka afọ 2018 ji nwayọ bịara n'isi njedebe, BBC Igbo na-echetara ụnụ akụkọ ndị mere ka obodo kpoo ọkụ n'afọ ahụ.

Nke gbara ụwa niile gharị bụ akụkọ mpụtagharị Nnamdi Kanu n'obodo Jerusalem kemgbe ọnwa Septemba nke afọ 2017.

Nke mekwara nso nso a ma bụrụ nke ka na-ewu, bụ akụkọ Jubril nke Nnamdi Kanu kwuru na onyeisiala Naịjirịa bụ Buhari abụghị onye nọ n'Aso rock.

BBC Igbo buru ya dịka akụkọ ụgha nke a kpọrọ "Fake news"

Nke mekwara nso nso a ma bụrụ nke ka na-ewu, bụ akụkọ Jubril nke Nnamdi Kanu kwuru na onyeisiala Naịjirịa bụ Buhari abụghị onye nọ n'Aso rock.

BBC Igbo buru ya dịka akụkọ ụgha nke a kpọrọ "Fake news"

Onyeisiala pụtara kwuo na ọ bụghị Jubril.

Okwu Fada Mbaka gwara Peter Obi mgbe ọ gara ịka ụka "Bazaar" kpokwara obodo ọkụ.

Mmepe ụlọọrụ BBC nke mere n'ọnwa Febrwar wuru ewu nke ukwu.

Ka anyị mepechara, anyị wetaara unu akụkọ ihe nwunye Nnamdi Kanu gwara anyị gbasara ebe di ya nọ.

Okwu o kwuru kpalitere ọtụtụ asịsa n'ebe ndị ọnụ na-eru n'okwu na Naịjirịa nakwa gọọmenti etiti nọ.

Akụkọ ọzọ dara ụda bụ akụkọ nwaanyị Igbo akpọrọ Mama Boko Haram.

Aisha Wakil gwara BBC Igbo etu o si zụọ ụmụaka bụ ndị otu Boko Haram taa.

Akụkọ Ụkọchụkwụ ama ama na Naịjịria mụrụ ụmụ ejima atọ ka afọ iri na itoolu gafechara, nyere ụmụ Igbo nakwa Naịjirịa niile oke obi ụtọ.

Okwu Abaribe kwuru maka ndị ọchịehi wuru ewu n'afọ 2018.

Asọmpi iko mbaụwa niile narakwara ụmụ Igbo uche.

Ọzọ so ya bụ akụkọ nwuchi ụmụnwaanyị Ipob otu nar na iri anọ n'Owere.

Mmiri ide kpara mkpamkpa n'ala Igbo n'afọ 2018.

Akụkọ ha kpalitere nkata a na-akpa maka IVF.

Ụmụnwaanyị ise si n'ụlọakwụkwọ Regina Pacis dị n'Onịcha kpakwara ndị Igbo mgbe ha turu ugo n'asmpi Technovation 2018 site n'ịbụ ọkaibe n'ụwa niile.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: