Buhari: Mbaka gwara Buhari: Ihe ndị mmadụ na-ekwu

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Ndị mmadụ tinyere ọnụ n'okwu gbasara Fr. Mbaka na ihe ọ gwara Onyeisiala Muhammadu Buhari maka etu o si achị Naịjirịa.

Ka Fr.Mbaka na-aka ụka ụbọchị ole na ole gara aga, o kwuru sị na ọchịchị Buhari adịghị mma maka na ọ bụ "ọchịchị nchịgbu".

O kwukwara na Buhari anaghị eme ka onye nkwafu ọbara mmadụ na-emetụta n'ahụ.

Nke a bịara dịka ihe mgbawojuanya nye ụfọdụ ndị mmadụ mere ha ji tinye ọnụ ikwu na ọ tụrụ ha n'anya na Mbaka kwadoburu Buhari nwere ike ịtụgharị kwuo ụdịrị okwu a.

Ihe ndị mmadụ kwuru

Ụfọdụ kwenyere n'ihe o kwuru, ebe ndị ọzọ na-ajụ ma ọ bụ ugbua ka o bidoro ịhụ ihe ha bidoro ikwu kemgbe.

Ethelbert Ugwuegbe C kwuru sị "Biko juo nwa Mbaka ma pigeon ya oka n'efekwa."

Afunwa Elota Nna kwuru sị "ịgwa gị eziokwu aghọtaghịzị m Mbaka, ọkwa yanwa gwara anyị na Buhari bụ onye nzọpụta, mana kịta o kwugharigo".

Chukwuemeka Kingsley Chinemeze Kwuru sị "Mbaka na-ekwu okwu abụọ. Kedụzị nke anyị ga-eso?"

Omeh Chuks Godwin's Kwuru sị "Nke a bụ eziokwu, mana Fr.Mbaka so tinye Nigeria na nsogbu a."

Maazi Chimaobi Amaefuna kwuru sị, "Mbaka, anyị achọghị ndụmọdụ gị ọzọ. Nke mbụ i kwuru dobere Naijiria n'ọnọdụ ọ nọ ugbua mgbe ị gwara ndị mmadụ ka a tụnyere "#Demon_cracy".

Lee ihe ndị ọzọ kwuru ebe a:

Akụkọ ndị ga-amasị gị: