You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ndị si APC lọghachite PDP alụọla nwaanyị abụọ mara nke ka mma - Uzochukwu
Uche Uzochukwu bụ onye PDP n'Enugwu steeti kwuru na oge e mere ndọrọndọrọ ọchịchị na 2015, na ndị Naịjirịa chọrọ ka PDP pụọ, mana ugbua ndị gbapụrụ na PDP chọrọ ịlọghachite.
O kwukwara sị na oge Jonathan chịrị, o nyere onye ọbụla ohere Bekee kpọrọ 'level playing ground'.
O kwukwara na ihe mere n'Abuja ebe ndị omeiwu si n'APC gafee PDP, bụ ihe a tụwara anya.