You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ụlọikpe akpọchiela ụmụnwaanyị Ipob 114 n'ụlọ mkpọrọ
Ụlọikpe dị n'owerri nke ọkaikpe S.K Kadurumba nọ n'isi ya enyela iwu ka akpọchie ụmụnwaanyị Ipob n'ụlọ mkpọrọ rue abalị atọ nke ọnwa Seputemba.
Ndị uweojii nwụchiri ụmụnwaanyị ndị a na fraịde gara aga mgbe ha na-eme ngagharị iwe n'Owerri.
Ndị uweojii Imo Steeti kpọpụrụ ụmụnwaanyị ndị a n'ụlọikpe n'ebubo ịgba izu nkata megide iwu na-achị Naịjirịa.
N'ikpe ya, ọkaikpe S.K Kadurumba kwuru na onweghi ikikere ịtọhapụ ha n'ebubo eboro ha ma nye iwu ka-akpọchie ha n'ụlọikpe rue mgbe a ga-azagharị ọnụ ha ọzọ n'abalị atọ n'ọnwa Seputemba.
N'ozi Ọkaiwu ndị Ipob bụ Ifeanyi Ejiofor zitere BBC Igbo, o kwuru na ha bịara ịgbapụta ụmụnwaanyị Ipob n'ụlọ mkpọrọ ka ha si n'ụlọ na-abịa ikpe.
O kwuru na ọkaikpe a wepụrụ ebubo nke metụtara Ipob ị bụ otu akagburu akagbu na Naịjirịa site n'arụmaụka o mere banyere nke a.
O kwuru na ha ga-eburu ikpe a ga n'ụloikpe ukwu nke dị n'Imo steeti bụ nke nwere ikike ilebanye n'ebubo ndị dị aṅya e boro ụmụnwaanyị a.
Ejiofor gara n'ihu jụọ ajụjụ si kedụ etu gọọmenti ga-eji kwuo na ndị agadi nwaanyị na-atụmatụ i chutu gọọmentị na-achị Naịjirịa?
O kwuru na ndị nne a na-egosipụta ikike na ugwu ruru ha n'inwe ọgbakọ dị ka ngalaba iri anọ (Section 40) nke iwu Naịjirịa kwadoro ya.