Ihe ndị uweojii mere ụmụnwaanyị Ipob na-eme ngagharịiwe

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ndị uweojii n'Imo steeti nwuchiri ụmụnwaanyị otu Ipob ruru otu narị maka ime ngagharịiwe n'Owere ụnyaahụ bụ Fraịde.

Ụmụnwaanyị a so na ndị ruru puku abụọ si na steeti dị iche iche n'ọwụwa anyanwụ Naịjirịa mere ngagharịiwe na-ekwu ka a tọhapụ onyeisi otu Ipob bụ Nnamdị Kanu.

Dịka ụmụnwaanyị ndị a mere ngharịiwe na-ebo ebubo na ndị agha Naịjirịa ma ebe ha dowere Kanu, onye na-efu efu kemgbe afọ gara aga oge ha gbachara 'Egwu Eke' nke abụọ n'ala Igbo.

Ụmụnwaanyị ndị a eyighị akwa-elu, ebe ụfọdụ yi akwa ojii ma na-agụ egwu agha na-agharị n'ọtụtụ okporoụzo, dị n'Owere nke butere ọtụtụ ụgbọala ịkwụ n'ahịrị.

Akụkọ kwuru na ụmụnwaanyị a bidoro gbawa egwu oge ndị uweojii zutere ha, ebe ndị uweojii gbara ha ikuku ọkụ (teargas), merụọ ụfọdụ ahụ ma nwuchikwa ọtụtụ n'ime ha.

N'okwu ya, ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na steeti ahụ bụ Andrew Enwerem kwetara na ndị uweojii ji ụmụnwaanyị Ipob ruru otu narị maka " Ime ngagharịiwe na-anataghị ikike n'aka ha, ya na maka ịbụ ndị otu iwu mabidoro."

"Ị ma n'ihe gbasara the Indigineous Biafra gọọmenti Naịjirịa mapụrụ ya n'iwu."

"Nke abụọ ha agwaghị ndị uweojii. Ha bịara na-anọchi okporoụzọ na-eme ihe nwereike ibute ọgbaghara."

"E jidere ihe karịrị otu narị. Onweghị onye merụrụ ahụ, onweghị onye nwụrụ."

Enwerem ekwetaghị, nke ọ na-agọ na ndị uweojii gbara ụmụnwaanyị ahụ ikuku ọkụ.

Gee ihe o kwuru n'uju ebe a:

Akụkọ kọrọ na otu nwaanyị dị ime dara n'ihi ikuku anwụrụ ọkụ a gbara.

Otụtụ ndị mmadụ na-akpọ oku na soshal midia ka ndị uweojii tọhapụ ụmụnwaanyị ndị a ha ji.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: