You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Mavrodi bụ onye bidoro MMM anwụọla
Ka Sergei Mavrodi bụ onye bidoro ebe a na-atụkọ ego iji nweta mmụbanye ego ọzọ nke ọ kpọrọ Mavrodi Mundial Moneybox (MMM), nwụrụ taa, ndị mmadụ ekwuputala uche ha gbasara ọnwụ ya.
Mavrodi dị afọ 62, nwụrụ taa n'obodo Moscow, ka ndị dọkịta kwuru na nkụchi obi (heart attack) gburu ya.
Tupu ọ nwụọ, Mavrodi bụ onye mba Rọshịa a ma-ama n'ihe gbasara ịghọgbu ndị mmadụ ma nara ha ego ha, nke ndị bekee kpọrọ ponzi scheme, kpara ọtụtụ ego.
Ngalaba MMM nke bidoro ọrụ na Naịjirịa n'afọ 2015, kwụsịrị ịrụ ọrụ n'ọnwa Disemba nke afọ 2016 ka ihe ruru mmadụ nde abụọ na puku narị anọ bidoro iji ya enye ma kpata ego.
Ha kwuru na ihe kpatara ha ji kwụsị ọrụ bụ maka "ndị mmadụ ka nkụ n'elu sistem anyị nakwa anya ọjọọ ndị gọọmentị na ndị ntaakụkọ ji ele anyị"
Ihe ndị Naịjirịa na-ekwu gbasara ọnwụ Mavrodi
Ụfọdụ kwuru na ọ bụ 'ekpere' ndị Naịjirịa ego ha furu n'ime MMM kpere kpatara o jiri nwụọ
Ebe ụfọdụ na-ekwu na o nwere ike ịbụ aghụghọ ka ọ ghọrọ
Ụfọdụ kwuru na ọ bụ ụjọ ihe ndị Naịjirịa gaara eme ya mgbe ha ga-abịa ile asọmpi iko mbaụwa na Rọshịa bụ ebe Mavrodi si, mere o jiri nwụọ iji gbaara nsogbu ọsọ.
Ụfọdụ chetara ego ha furu efu n'ime MMM. Ha jụrụ ihe ga-eme ego ha ugbua Mavrodi nwụrụla
Ihe amabeghị ugbua bụ ihe ọnwụ Mavrodi ga-apụtara ndị ka nwere nchekwụbe na MMM ga akwụ ha ụgwọ.
Akụkọ ga-amasị gị: