You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Naijiria Vs Serbia: Mikel Obi atụọla arịrị
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1
Obi adịghị kaptin ndị Super Eagles bụ Mikel Obi, mma maka na ọ gaghị eso gbaa bọọlụ asọmpi enyi na enyi nke dị n'etiti Naijiria na Serbia echi.
Mikel na-agba mbọ inweta akwụkwọ mba Chaịna ebe ọ na-agbara otu egwuregwu Tiajin Teda, bọọlụ.
Nke a bụkwa ihe mere na o soghị n'asọmpi Naijiria na ndị Poland gbara n'izu gara aga.
Mikel kwupụtara ka ọ dị ya n'obi gbasara asọmpi echi n'igwe okwu, 'Twitter' sị: "N'ihi ọnọdụ m amaghị ka m ga-esi mee, agaghị m esonye n'egwuregwu anyị na ndị Serbia ga-agba echi.
"Obi dị m mwute, ike gwụrụ m, mana ana m enye ndị otu anyị nkwado m niile."