Iwobi erutela ogige ndị Super Eagles na Poland

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Nwaamadị na-agbara Arsenal bọọlụ bụ Alex Iwobi esorola na ndị mbụ batara n'ogige ndị Super Eagles ka ha na-akwado ịsọ mpi nke enyi na enyi maka nkwado iko mbaụwa.

Cheta na Naịjirịa na Poland ga-agba bọọlụ ha n'ubọchị Fraịde na-abịa n'ọdọ bọọlụ Municipal dị n'obodo Wroclaw nke dị na Poland.

Na Twitter, akara ndi Super Eagles nabatara Iwobi:

William Troost-Ekong, Alex Iwobi, Ola Aina, Tyronne Ebuehi, Brian Idowu na Leon Balogun so na ndị nọ na ogige ugbua. A na-ele anya na ndị ọzo ga-abata tupu o ruo ehihie Tuesde.

Ndi ọzọ ga-eso n'asọmpị a bụ :

  • Ndị nche goolu: Francis Uzoho (Deportivo La Coruna, Spain); Ikechukwu Ezenwa (Enyimba FC); Daniel Akpeyi (Chippa United, South Africa)
  • Ndị nche azụ: Abdullahi Shehu (Bursaspor FC, Turkey); Tyronne Ebuehi (Ado Den Haag, The Netherlands); Olaoluwa Aina (Hull City, England); Elderson Echiejile (Cercle Brugge KSV, Belgium); Brian Idowu (Amkar Perm, Russia); Chidozie Awaziem (Nantes FC, France); William Ekong (Bursaspor FC, Turkey); Leon Balogun (FSV Mainz 05, Germany); Kenneth Omeruo (Kasimpasa FC, Turkey); Stephen Eze (Lokomotiv Plovdiv, Bulgaria)
  • Ndị ogba n'etiti: Mikel John Obi (Tianjin Teda, China); Ogenyi Onazi (Trabzonspor FC, Turkey); Wilfred Ndidi (Leicester City, England); Oghenekaro Etebo (Las Palmas, Spain); John Ogu (Hapoel Be'er Sheva, Israel); Uche Agbo (Standard Liege, Belgium); Joel Obi (Torino FC, Italy)
  • Ndị na-agba n'ihu: Ahmed Musa (CSKA Moscow, Russia); Kelechi Iheanacho (Leicester City, England); Moses Simon (KAA Gent, Belgium); Victor Moses (Chelsea FC, England); Odion Ighalo (Changchun Yatai, China); Alex Iwobi (Arsenal FC, England); Junior Ajayi (Al Ahly, Egypt); Gabriel Okechukwu (Akwa United) .

Akụkọ ndị ga-amasị gị: