You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Gịnị mere ndị ụlọakụ ji amịpụ ego ndị mmadụ n'ụzọ na-ezighi ezi?
Ọtutụ ụmụ Naịjirịa ajụọla ajụjụ a dịka ha na-ekwuputa mwute ha gbasara ego ndị ụlọakụ ha na-ewepu n'ego ha n'ụzọ na-ezighi ezi.
N'ọnwa Jenụwarị 2018, ndị ụlọomeiwu sineti kpọrọ onyeisi ụlọakụ ukwu (CBN) bụ Godwin Emefiele, ka ọ bịa zara ọnụ ya ma kọwaara ụmụ Naịjirịa ihe kpatara o ji dị ka ego ha enweghizị ezigbo nchekwa n'ụlọakụ ebe ha debere ya.
Nke a bụ maka na ọbụrụ na ndị ụlọakụ anaghị ewepu ego maka ozi ha zitere gi, ha na-ewepu ego maka kaadị eji ewere ego.
Ndị a abụghị nsogbu mana ihe na-agbagwoju ndị mmadụ anya bụ ugboro ole a na-ewepụ ego ndị a n'ime otu ọnwa.
Nke a bụ maka na otu onye ihe a metụtara gwara BBC Igbo na oteela ihe a na-eme, wee zitekwara anyị foto ụfọdụ gbasara mwepụ e mere n'ego ya.
Foto a na-egosi ego ndị ụlọakụ a wepụrụ n'ego mmadụ maka otu ihe n'ime naanị ọnwa Jenuwarị. Ha wepụrụ naịra iri ise n'ego onye ahụ ugboro atọ maka otu ihe n'ọnwa Jenụwarị.
Ọbụghị naanị ihe a ka ndị mmadụ na-ekwu maka ya, a na-ekwukwa na ebuturu ego ole a na-ewerezi n'igwe eji ewere ego bụ ATM n'aha ịchafụ.
Tupu ugbua, ATM na-enye ihe ruru puku naịra iri abụọ otu oge nke bụ ị dọrọ ego rue ugboro atọ n'ụlọakụ na-abụghị ụlọakụ gị, ewepụ ego maka ya.
Mana ugbua, ọtụtụ ụlọakụ na-enye naanị puku naịra ise nke pụtara na tupu ị were puku iri abụọ ahụ i nwere ike iwere na mgbe mbụ, ị ga-ewere ego ihe ruru ugboro anọ, ị chọzịa iwere ihe ruru puku otu narị naịra, a ga-ewere ego gị karịa.
Gịnị kpatara ihe dị otu a ji eme ebe ndị ụlọakụ nwere ndị ntuziaka bụ ụlọakụ ukwu CBN?
Ọpụtara na CBN anaghị etinye uchu n'ihe ndị ụlọakụ a na-eme? BBC Igbo gbalịrị inweta ndị ụlọọrụ CBN mana ha azaghị oku.