You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Okwu Naịjirịa na Boko Haram ọ ga-akwụsi agha?
Okwu na-akpọtụ na Naịjirịa ugbua bụ na ndị Boko Haram na gọọmentị Naịjirịa na akpakọrita uka banyere etu a ga-esi were belata maọbụ kwụsị mgbọ a na-akwa n'ọwụwa anyanwụ nke ugwu Naịjirịa.
Nke a bụ mbụ gọọmentị Naịjirịa na-ekwu na ya na Boko Haram na-akpakọrita ụka na nsọ a. Onye kwuru maka olileanya a bụ Lai Mohammed, bụ Mịnịsta na-ahụ maka mgbasa ozi.
Akpam ike Boko Haram, n'agha Naịjirịa na-ebuso ha egbuola mmadụ puku kwuru puku kemgbe 2009 nsogbu a bidoro. Mana ọchịchị Onyeisiala Muhammadu Buhari na-ekwu na mbụ na ọ ga-amasị ha ka akpakọrịta ụka.
Lai Mohammed kwuru n'ozi o zigara ndị ntaakụkọ iji kọwa etu e siri gbapụta ụmụakwụkwọ Dapchi na,"Ọtụtụ mmadụ amaghị, mana anyị na-akpakorịta ụka ịhụ ma anyi na ndị ọlụọla a aga-ekweta ka akwụsịlata ịkwa mgbọ."
Ndị Boko Haram kpọlatala ụmụaka ahụ n' ụbọchị 19 nke Febụwarị.
Ụmụakwụkwọ ahụ kwuru na ise n'ime ha nwụrụ ka e ji ha, dịka aka ka ji otu onye n'ime ha.
Mohammed kwuru na nkwụsịlịta ịkwa mgbọ nke izuụka bidoro n' ụbọchị Maachị 19 nke afọ a nyere ohere iji kpọlata ụmụaka a.
Akwụkwọ ozi Mohammed kọwara na ọ bụ mmadụ 111 ka a tọọrọ na Dapchi, nke bụlitere ọnụọgugụ ndị a tọrọ site na 110 ha kwuru na mbụ.
Akpọghachịrị ụmụaka Dapchi ahụ oge ụka ka ha siri Abuja ebe ha gara ịhụ Onyeisiala Muhammadu Buhari lọta.`
Nkewa dị na Boko Haram
Mohammed Kwuru, "Anyị nwere ohere itinye ọnụ n'okwu ndị ọzọ mgbe a tọrọ ụmụ Dapchi."
O mechara gwa ndị ntaakụko Reuters n'ekwentị sị:"Ihe anyi na-ele anya bụ ka igba egbe a kwụsị kpam kpam."
Mana, amaghị otu Boko Haram nke ha na gọọmentị Naịjiria na-akpakọrịta ụka ugbua.
Al-Barnawi bu onye a na-eche na ọ bụ nwa Mohammed Yusuf, bụ onye bụ isi sekpụ ntị na Boko Haram bụ onye a na-eche na ọ bụ ya kpara ike Dapchi, ebe Abubakar Shekau bụ onye na-achị otu Boko Haram ọzọ.
BBC gbara otu onye ọnụ na-eru n'okwu bụ Maazị Chris Kehinde Nwandụ ajụjụ ọnụ gbasara ihe gọọmentị kwesịrị ime.
Maazi Nwandu kwuru na okwu a Naijirịa na Boko Haram na-ekwu abaghị uru cha cha, maka ndị Boko Haram akwụsịgbeghị ike ha na-akpa.
Nsogbu gbasara Boko Haram aghasaala mpaghara ọwụwa-anyanwụ nke ugwu Naịjirịa kamgbe o bidoro n'afọ 2009.
Akụkọ ga-amasị gị: