Ụlọikpe: Ndị Boko Haram ga-enweta ikpe ruru ha

Ụlọikpe ukwu nke Naịjira amalitela ikpe ndị Boko Haram ruru otu puku akpọchiri ọtụtụ afọ ikpe nke abụọ n'ụbọchị taa n'ọdọ ndị agha dịna Kaịnji, ebe a na-atụ anya na ha ga-awụcha nụlọikpe ọdịnala.

Ndị ụlọikpe kwuru na a ga-ama ndị a ikpe n'ihu ọha dịka ndị otu na-ahụ maka ugwu ruru mmadụ n'akwa Amnesty International katọrọ ikpe nke mbụ.

Ikpe nke a bụ nke kachasị n'ikpe a na-ama ndị na-eyị ndụ ekwu n'ala Naịjirịa.

Ihe karịrị ndị ọkaịkpe anọ ga-ekpe ndị a ikpe n'ụlọ mkpọrọ ndị agha.

A kwụsịrị ikpe n'ịme ọnwa anọ gara-aga, iji nye ohere ka ndị nchekwa mee nyocha gbasara ndị Boko Haram. dịka Mịnịstịrị na-ahụ maka ikpe ziriezi kwuru.

N'ọnwa ọktoba 2017 bụ mgbe ikpe a malitere, amara mmadụ iri anọ na ise ikpe ị ga mkpọrọ afọ atọ rue afọ iri atọ na otu, ebe atọhapụrụ ihe karịrị mmadụ narị anọ maka nweghi ihe aka ebe megidere ha.

A na-atụ anya ị ma kwa ọtụtụ ndị otu a ndịọzọ ikpe n'ọge n'abịa abịa. n

Cheta na ndị Boko Haram egbuola ihe karịrị mmadụ puku iri abụọ ebe ha chụpụrụ mmadụ ruru nde na mpaghara Naịjirịa, Chadị kamgbe ha malitere n'afọ 2009.