Akụkọ kachasi taa: Onye bidoro MMM anwụọla

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Akụkọ ndị kachasị mkpa mere taa n'ichafu:

Gọvanọ Anambra steeti họpụtara ndị kọmishiọna ọhụrụ.

Gọvanọ Anambara steeti bụ Willie Obiano, edoola ndị kọmishịọna ọhụrụ iyi ọrụ.

Obiano họpụtara kọmishiọna 19 na ndị ndụmọdụ pụrụiche 11, bụ ndị ga-eso ya rụọ ọrụ agba nke abụọ.

O kwuru na obi kara ya na ndị a ṅụrụ iyi ọrụ ga-arụ ọrụ ha etu o kwesịrị, ma dọọ aka na ntị na ọ ga-achụpụ onye ọbụla na-arụghị ọrụ ha ọfụma n'ime ụbọchị 100.

PDP rịọrọ mgbaghara

Otu party PDP arịọọla ndị Naịjirịa mgbaghara maka mmehie ha mehiere oge ha nọ n'ọchịchị.

Onye isioche ha bụ Uche Secondus rịọrọ arịrịo a ka ha nwere ọgbakọ n'Abuja taa.

Na mba ofesi

Sergei Mavrodi bụ onye bidoro ebe a na-atụkọ ego iji nweta mmụbanye ego ọzọ nke ọ kpọrọ Mavrodi Mundial Moneybox (MMM), anwụọla.

Mavrodi dị afọ iri isii na abụọ, nwụrụ taa n'ụlọọgwụ dị n'obodo Moscow, ka ndị dọkịta kwuru na nkụchi obi nke bekee kpọrọ (heart attack) gburu ya.

Tupu ọ nwụọ, Mavrodi bụ onye mba Rọshịa a ma-ama n'ihe gbasara ịghọgbu ndị mmadụ ma nara ha ego ha, nke ndị bekee kpọrọ ponzi scheme, kpara ọtụtụ ego.

N'egwuregwu

Ndị ụlọakwụkwọ gọọmentị kolleji Owerri emeriela n'asọmpi cricket nke mbụ a na-eme na mpaghara ọwụwa-anyanwụ maka ụmụakwụkwọ secondary.

Government College na Regal secondary school, nke dị na Nri, Anambra steeti, sọrọ mpi nke ngwụcha iji rite iko nke Omezua Okoro Ezi Okoro.

Ihe ndị ọzọ ị kwesịrị ịma taa

Gere akụkọ mere taa n'otu nkeji

Ihe nkiri nke taa

Ị ga-emenwu ka anụmanụ?

Lekwa nwaamadi na-eje mkpọtụ ụmụanụmanụ ọfụma.