Abike Dabiri: Okwu ndị zuru ohi na Dubai abụghị okwu agbụrụ

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ụmụ Naijiria ọkachasị ndị Igbo e jirila ọnụ saa onye enyemaka pụrụ iche nke onyeisiala Muhammadu Buhari n'ihe na-eme na mba ndị ọzọ bụ Abike Dabiri ka akwa.

Nke a bụ maka okwu o kwuru maka ụmụ Naijiria a nwụchiri n'ala Dubai maka ịga ohi n'ụlọ mgbanwe ego zuo nde Dh abụọ na ụma.

N'ụbọchị Monde, Dabiri-Erewa kwụrụ na Naijiria ga-ana akpọpụtazị aha ndị mere mpụ na mba ọzọ iji menye ha ihere n'ihu.

Nke a na-eme dịka ọ kpọpụtara aha mmadụ ise bụ ndị Igbo a nwụchiri maka izu ohi na Dubai.

Mana ụkwụ ahụ ọ zọpụrụ were ọtụtụ ụmụ Igbo iwe.

Ọtụtụ kwuru na ọ kpọpụtara aha ndị ahụ iji kwaa Ndigbo emo dịka ọ hapụrụ ịkpọpụta aha ndị agbụụ ndị ọzọ e jiderela na Dubai maka ibu ntụ na mpụ ndị ọzọ.

@soulwinner4sure kwuru na ọ dị mma ka ndị zuru ohi taa ahụhụ dịrị njọ ha mana ya (Dabiri-Edewo kwesịrị iwepụ akpọmasị n dịka onye ndu.

@il_Cavalier Na ahụta okwu dịka ịkparị ndị agbụụ ndị ọzọ.

@edozie01 kwuru na ọ bụ ihe ihere na Dabiri chezọrọ ịkpọpụta aha mmadụ ise e gburu na Saudi Arabia maka ibu ntụ.

"Okwu abụghị maka agbụrụ onye si na ya. Onye ọbụla si Naijiria gaa mba bụ otu akwụkwọ Ala Naijiria aga."

"Anyị e kwesịrị ị na-eto ndị gara zuo ohi na Dubai?"

"Aha ndị a kpọpụtara na foto ha efesasiala n'ebe niile na mba ha gara ohi."

O kwuru na ndị ahụ ga-ata ahụhụ dịị ha maka mpụ ha mere.

Akụkọ ga-amasị