You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Davido nọ na njem ịgba ọgọ n'ikwu nne ya site n'ịlụta Chioma
Ma iji ya gụọ egwu, ma ịsị na ọ bụ ọpụrụiche n'etiti ụmụnwaanyị niile no ya n'akụkụ, David Adeleke bụ onye eji Davido mara egosila ụwa na ya hụrụ nwaada Chioma Raymond n'anya.
Nke a mere onweghi onye ọtụrụ n'anya mgbe asi na asị malitere ịpụta na ọ gara njem ịkụ aka n'ụzọ n'obi ndị nwe Chioma n'izu ụka gara aga.
Mana, ya bụrụ na ị so ndị na-agwa ọnụ na oti egwu a ama ama nọ njem alụmdị na nwunye ya na Chioma, o suru okwu ahụ kpọm ụnyaahụ mgbe ọ gburu ikpere n'ala ji mmgba aka gechie ya.
Nke a mere n'obodo Eliza bụkwa mbu ndị mmadu na-ahụ n'anya na ya bụ nwaada rijuru afọ.
Davido dere n'akara Instagram ya na Chioma kwenyere na ha abụo ga-amalite ezinaụlọ dịka di na nwunye.
Chioma na onwe ya ji "A hụrụ m gi n'anya" gbasa ozi atumatụ a.
Cheta na foto Chioma tinyere n'akara Instagram ya n'izu ụka gara mere ka ọtụtụ mmadụ na-ekwu na Davido gara ịkụ aka n'ụzọ dịka omenala Igbo siri kwuo.
Na soshal midia ndị mmadụ na-eti mbada mkpu maka atụmatụ a.
Davido deburu na Twitter na agbamnkwụ ga-eme n'ime afọ 2020.
Ka ọ kwụ ugbua, Davido nọzị njem ime ka nna ya ochie site na-ịga n'ikwu nne ya ochie bu ala Igbo ga lụta nwaanyi.
Mana, onwekwara ndi na-aju ma a na-akụ aka n'ụzọ tupu ajụọ nwaanyị ka ọ ga-alụ n'agba ọhụrụ?