Davido New baby: Nwaanyị ọ chọrọ ịlụ amụọlara ya nwa 'agbaagba' nwa nwoke

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Ure nwa ooooo!

Davido etiwasala akụkọ ahụ ụmụ ụwa na-eche kamgbe.

Cheta na oti egwu ama ama dịka Davido(David Adedeji Adeleke) depụtara ọsịsa o nyere onye na-ajụ ya maka egwu ọ ka na-etipute etipute, ndị mmadụ buru okwu ahụ gawa "ụlọakụ".

Ọtụtụ ụmụ Naịjiria bidoro kelewe Davido makana ha chere na ọ bụ ọmụmụ nwa Chioma(onye ọ chọrọ ịlụ).

Mana n'oge na-adịghị anya, Davido depụtara na David nke obere awụchiela ma tokwa nwunye ya bụ Chioma, na-ekwu na o siri ike.

Lekwa ụfọdụ ekele ụmụ Naịjirịa bunyere Davido ka o depụchara na nwunye ya amụọla nwa.

@_omoissy kwuru na ọ nọ na-eche akụkọ ọma kamgbe elekere iri na otu nke abalị fotere taa.

@Amchizzy kelekwara ya.

@Real_jaeflex na-ekpere ha ekpere ọma.

@@PluckyPrecious kelere Davido maka etu o si kele nwunye ya.

Akụkọ ndị ga-amasị gị