You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Wizkid: Lee ka izu ụka a siri gara ndịa ama ama
Dịka izuụka a na-agwụ. Ọtụtụ ihe mere ka izuụka pụọ iche. Lee ụfọdụ ihe mere ka ị ghara ichefu izuụka a.
Wizkid - #soundman
Oti egwu bụ Wizkid mere 'Ogbara Igbo gharị' dịka otiputara egwu ọhụrụ mgbe ndị mmadu na-atụghị anya ya.
Ya bụ egwu ọ kpọrọ 'Soundman Ep' mere ka ndị na-akwado ya na ndị ọzọ kpupụrụ ya okpu.
Lee ihe ndị mmadụ n'ekwu maka ya
Orji Uzo Kalu
A mara Kalu Ikpe ibuba ego dị ijeri asaa, iri isii na ise (7.65bn) bụ nke ha na Udeh Udeogu bụbu onye okwu ego dị n'aka na n'ụlọomeiwu Abia steeti mgbe Orji Uzo nọ na ọchịchị bubara mgbe ọ na-achị Abia steeti.
Lee ihe ndị mmadụ n'ekwu maka ya
Omoyole Sowore
Ndị uweojii Naịjirịa a kpọrọ "Department of State Security" (DSS) anwụchiela Omoyele Sowore ọzọ.
Nke a na-abịa na-erughi awa iri abụọ na anọ e ji tọghapụ ya n'ụlọmkpọrọ ka ụlọikpe nyechara iwu ka a hapụ ya.
Lee ihe ndị mmadụ n'ekwu maka ya
Cardi B - #CardiBinLagos
Oti egwu ama ama bụ 'Cardi B' si Mba Amerịka awụchiela Naijirịa ime ihe emume nke a kpọrọ 'Livespot X Festival' na Legos.
Ọ bụ n'ụbọchị 7 nke ọnwa Desemba 2019 ka ya bu ihe emume ga-akpọtu.
Lee ihe ndị mmadụ n'ekwu maka ya
Anthony Joshua - #RuizJoshua2 #ClashOnTheDunes
Anthony Joshua ga enwe ohere ị nata Andy Ruiz ntụrụụgo nke itiọkpọ ọnapụrụ ya na ọnwa Jun 2019.
Ha ga-ezute kwa onwe ha ọzọ n'ụbọchi 7 nke ọnwa Desemba 2019 na mba Saudi Arabịa.
Lee ihe ndị mmadụ n'ekwu maka ya
Onyendu Everton - Marco Silva
Ihe na-ewuzi na 'English PRemiership' dịka o bụzi ichu ndi ndu ha.
Dịka ndị Tottenham chụchara onye ndu ha ka ndị nke Everton chụrụ onye nke ha.
Lee ihe ndị mmadụ n'ekwu maka ya
David Oyedepo - 'Hate speech Bill'
Onye ndu ndị ofufe nke Kraịst nke "Winners Chapel' bụ David Oyedepo akagbuola iwu gọọmentị na-achọ imepụta a kpọrọ 'Hate Speech" n'okwu bekee.
Dịka ụlko mgbasa ozi na Naijiria siri dee; " Anyi a na-aga ihu ka anyi a na-aga azu n'obodo a" David Oyedepo.
Lee ihe ndị mmadụ n'ekwu maka ya
Amarachi Onyedilefu - Blind Baker
I hụtụla onye kpuru isi na-eme achịcha bekee ọfụma? Nke a bụ ihe BBC Igbo hụrụ mgbe anyị gara zute Amarachi Onyedilefu.
Nwagbọghọ a gwara anyị na o kpuru isi kamgbe ọ dị na nwata mana agbanyeghị ọdachị a, ọ gaala mahadum ma na-emepụta achịcha bekee.
King Woman : Omu nke Okpanam
Ezenwaanyị Obi Martha Onyemachi Dunkwu bụ onye nọ n'ọkwa pụrụiche n'Ọkpanam malitere afọ narị asaa gara aga bụ nke na-elekọta ụmụnwaanyị ma bụrụkwa onye ji ọfọ agbara ha.
Onye nọ na-ọkwa dị otu a ka ha na-akpọ Ọmụ
Ifeanyi Ejiofor - Oraifite Crisis
Ndị uweojii kwuru na ha nwetara mkpesa megidere Ọkaiwu Ifeanyị Ejiofor, kpọọ ya oku, ọ zaghị ha, ha gaa n'ụlọ mana ndị Ipob luso ha ọgụ, gbuo mmadụ abụọ ndị otu ha.
Ha gara n'ihu rịọ onye ọbụla hụrụ Ejiofor ka ọ gbara ha ama.