Anthony Joshua vs Andy Ruiz: Etu Anthony Joshua si 'kwadoro' Ruiz Jr

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Nwaafọ Naịjirịa bụ Anthony Joshua ga-ezute Andy Ruiz Jr na Saụdị Arebiya n'abalị Satọde a maka asọmpị nke abụọ ha nke ha ji azọ ihe nrite Bekee kpọrọ "World Heavy Weight Boxing Championship".

Nnukwute ọgụ na-eche mmadu abụọ na ọkpọ mpịagharịa ha ga-akpịa n'ama egwuruegwu Diriyah bụ ebe ga-abata mmadụ 15,000.

Ọ bụ n'elekere asatọ nke ehihe (8:30 PM) n'oge Naịjirịaa ka a ga-amalite isu ha bu ọkpọ.

Ọ bụ n'ọnwa Juun nke afọ 2019 ka Ruiz Jr narala Joshua ihe nrite niile oji aka mgbe ha zutere na obdodo New Yọk.

Joshua sị: "A no m ebe a imeri, egwu adịghị atụ m..., ekperem ekpere ma wepụta ohere ji nabata ihe ga-eme n'Satọde"

Ndị ọkụ ọkpọ abụọ a siri ime mgbe ha zutere n'ụbọchị Wenesde bu oge enyochara etu ha ra.