You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Anthony Joshua: Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ọdịda Anthony
Biko ọ bụ ihe ọjọ mmadụ ikwado onye be ya ma a na-eme asọmpị na mba ọzọ?
Udiri ajụjụ ga-adị n'obi Abike Dabiri ugbua dịka ndị mmadụ chịrị wunyere ya maka etu o si depụta nkwado ya nyere ọkpọ Anthony Joshua na Andy Ruiz tiri.
Lekwa ozi o depụtara n'elu Twitter ya
Mana ozigbo etichara ọkpọ ahụ, ọ bụrụ na Anthony Joshua dara ada, ụmụ Naịjirịa kpụrụ Abike Dabiri-Erewa n'ọnụ.
@dsadnezz kwuru na ọ bụ makana Abike na ndị otu ya gara ikiri ya bụ ọkpọ mere Anthony Joshua ji daa.
@ELEGBETE1 kwuru na Joshua na-emeri ọkpọ o na-etibu mana mgbe gọọmenti etiti na Abike banyere n'okwu ya, ihe ghasaa.
@DemolaOjo kwuru na kamgbe Joshua dara ọkpọ ya na Ruiz, Abike ekwubeghị okwu ọbụla.
Mana @BabajideFadoju katọrọ ndị na-akọjọ Abike ma kwuo na ọ bụ amaghị ihe na-eme ha.
@abiola_soremi kwadoro ekpere Abike kpere Anthony Joshua n'ọkpọ a.
Abike zọrọ isi onwe ya
Mgbe ndị mmadụ katọrọ etu o si kwupute na ndị ọrụ gọọmenti anọ gbatara akwụkwọ iji kirie ya bụ ọkpọ, Abike depụtara ihe ndị a na twitter ya.
@abikedabiri jụrụ ma ọ bụrụla njọ ka ndị ọrụ gọọmenti anọ ga kirie ya bụ ọkpọ.
Ihe ọ sara ndị si na ọ bụ ego gọọmenti etiti ka eji zụta ya bụ akwụkwọ iji kiri ọkpọ ahụ.
Cheta na Andy Ruiz piatụrụ Anthony Joshua n'ala ugboro anọ mgbe ha pịara ọkpọ n'ọgbo egwuregwu Madison Square Garden wee maburu ọkwa atọ ụnyahụ bụ ụbọchị nke mbụ ọnwa June.
Anthony Joshua na-apịachitere ndị mba Britain ọkpọ mana ọ bụ nwafọ Naịjirịa.