You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Blessing Okoro: Enweghị ndidi ka m rụchaa ụlọ m tinyere m n'ọnọdụ a, gbagharanụ
Mgbe akụkọ Blessing Okoro bidoro wuwe n'elu soshal midia, ọ gbara ụwa gharịi.
Ọtụtụ mmadụ tinyere ọnụ ha n'okwu ụlọ onye akpọrọ Onye Eze na China o ji eme mpako.
Mana ugbua Blessing edepụtala n'akara Instagram ya na ụta dịrị ya makana ọnweghị ndịdị ka ọ rụcha ụlọ ya nke mere ka o jiri ụlọ onye ọzọ na-eme ọnụ.
Blessing jikwa ohere ahụ wee rịọ ụwa mgbaghara.
O kwukwara na onweghị ndị uweojii nwuchiri ya dịka ndị mmadụ si eche.
Lee ihe ụfọdụ mmadụ sara ya
@sicko_swish gwara na ọ ka che na ya bụ Blessing ka na-atụ asị gbasara okwu a.
@coalm1605 kwuru na o kweteghị na mgbaghara a Blessing rịọrọ.
Mana @rheyman682 kwuru na ọ ga-agbaghara ya mana ọ ga-eji etu o si zuu ụlọ mmadụ na-echeta ya.
@jblazeroyalty kwuru na ọgbagharala Blessing mana ya pugodu na instagram nwantiti oge.
@renoomokri kwuru na mmadụ itụ asị na ọ bụ ya nwere ụlọ ọbụghị ya nwe abụghị arụ kama na ọ bụ ịga atụrụ Blessing n'aka bụ ihe ihere.
Ka akụkọ a si malite
Cheta na foto a na ozi so ya pụtachara dịka ihe ụbọchị ncheta ọmụmụ n'elu Instagram Blessing Okoro abanyela "ụgbọ nwamkpi".
Okoro depụtara n'elu foto o sere n'ụbọchị iri abụọ na atọ nke ọnwa Mee, na "di ọ lụrụ mbụ chụpụrụ ya afọ asatọ gara aga, mana taa ọ rụtala ụlọ nke aka ya".
Ka a na-ekwu nke a na-ekwu, otu onye sị na ọ ma onye nwe ụlọ ahụ Okoro, e ji "Blessing CEO" mara tinyere foto ya n'elu Instagram, kwuru na ọ bụghị Okoro nwe ụlọ ahụ.
Ọ kpọpụtara aha onye nwe ya dịka Onye Eze na-azụ ahịa na mba Chịna.
Ka a ka na-enyo okwu a enyo, Okoro gara ebe ụlọ ahụ dị sete ihe onyonyo ọzọ na-agwa ndị mmadụ na ụlọ nke ya dị iche n'ebe nke Onye Eze dị.
Ọ gakwara n'ihu kọwa na ọ banyeghi be Onye Eze dịka akụkọ si efegharị.
Nke a mere ka ndị na-eso ya bido kwuwe na ọ dị ka ọ na-atụ asị.
N'ehihie ụbọchị 27 nke ọnwa Mee, anyị hụrụ ihe nkiri ọzọ pụtaranụ ebe a tụrụ Okoro ịga n'ụlọ Onye Eze, ma na-agwa ya ka o kwuo n'ezie na ọbụghị ya nwe ụlọ o ji eme ngala.
Na-emeghi eme, Okoro pụtakwara kwuo na onweghi ihe mere ya, na okwu a ga-anyụ pịị makana onweghi ihe rijuru afọ na ya.
Ka ọ dị ugbua, anyị ezigarala Blessing Okoro ozi ka anyị na ya nwee mkparịtaụka.
Anyị ezigarala Onye Eze bụkwa onye nke na-ekwu na ụlọ ahụ bụ nke ya ozi, ka anyị na ya nwee mkparịtaụka, mana anyị enwetebeghi ọsịsa.
BBC Igbo ga-ewetere unu ihe ọbụla ha gwara anyị n'elu nke anya hụrụ n'elu soshal midia.