Budget 2019: Buhari etinyela aka n'akwụkwọ

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Onyeisiala Buhari binyere aka na Bọjeti 2019

O ruola n'omume, onyeisiala Buhari biyela aka Bọjeti 2019.

Bashir Ahmed onye na-enye onyeisiala Buhari aka depụtara akụkọ a n'igwe Twitter ya:

Ndị otu Ipob ekwuola na ọ bụrụ na ndị ọnụ na-eru n'okwu bidoro n'oge kwuwe maka ịmanye Naịjirịa n'okpukpere chi Alakuba , ihe akarị mebi etu ọ dị ugbua.

Emma Powerful bụ ọnụ na-ekwuru otu IPOB kwuru na okwu 'Fulanisation ' aka chiburu Naịjirịa bụ Olusegun Obasanjo bụ okwu Nnamdi Kanu na-ekwuritọ kamgbe.

Cheta na Obasanjo kwuru na ọ bụrụ na-eji aka ike wee ibuso ndị omekome akpọrọ Boko Haram na otu ndị ọzọ na-akpa mkpa mkpa na mpụ ha na-eme karị ịbụ akụkọ ochie.

Ndị uweojii nọ na Jos ekwuola na ọtụtụ mmadụ nwerike so na ndị nwụrụ anwụ n'ọgbaghara ọhụrụ mere na steeti ahụ.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Mathias Tyopev kwuru na ndị otu ya agaala na mpaghara ahụ imenyụ ọgụ a dapụtara ụnyahụ na Dutse Uku, Rikkos nakwa Cele Bridge.

Ụlọ a na-arụ kamgbe afọ 20 adaala n'Owerri

Dịka ndị Anambra ka na-enyocha ihe kpatara ụlọ ji daa n'Onicha, ụlọ ọzọ adaala n'Owerri mana akụkọ na-ewunu bụ na mmadụ anọ sepụtara isi na ya bụ ihe mberede.

N'egwuregwu,

Onyeisi otu egwuregwu Manchesyter city bụ Khaldoon Mubarak ekwuola ndị ibe ha na-ewuru ha anyaọkụ maka etu ha si eme nkeọma n'egwuregwu bọọlụ.

Cheta na ọ bụ ha bu otu egwuregwu beekee bu ụzọ merie iko eguregwu dị iche iche ugboro atọ dịka ha merichara watford na iko FA ọkpụ goolu isii asataghị otu.

N'ofesi,

Ihe mberede ụgbọ mmiri mere na Dr Congo egbuola mmadụ ruru mmadụ iri atọ gụnyere ọtụtụ ndị nkụzi gara ịnata ego ụgwọ ọnwa ha.

Ebe ndị omekome gbagburu mmadụ anọ n'ụlọụka Katọlik dị na Burkina Faso mgbe a na-aka ụka Sunday.

Nkeji

Ihe nkiri