World Population: Ọnụogụgụ ụmụnwoke na Naijiria rịrị karịa nke ụmụnwanyi kemgbe afọ 2016- NPC

Ndị Naijiria
Nkọwa foto, A na-ele anya na tupu afọ 2050 ọnụọgụgụ ndi Naijiria ga-erugo nde narị anọ na ụma

Ngalaba na-ahụ maka ọnụọgụgụ mmadụ na Naijiria e kwuola na ọbụghị ihe ọhụrụ na ọnụọgụgụ ụmụnwoke karịrị nke ụmụnwanyị.

Otu onyeisi ndị 'National Population Commission' kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC ụbọchị Tuusdee.

O kwuru na ọgụgụọnụ e mere na Naijiria na 2006 gosiri na umu nwoke ka n'ọnụọgụgụ.

N'oge ahụ, ụmụnwoke nọ na Naijiria di nde iri asaa na otu, puku nari atọ iri anọ na ise, nari anọ iri asatọ na asato (71,345,488).

Ụmụnwanyị dịkwanụ nde iri isii na itoolu, puku iri asatọ na isii, narị atọ na abụọ (69,086,302).

Mpụtara ọgụgụọnụ 2006

Ebe foto si, Opendata Afrika

Nkọwa foto, Mpụtara ọgụgụọnụ 2006

A na-echebu na ọ bụ ụmụnwanyị ka n'ọnụọgụgụ n'ụwa mana nchọpụta ọhụrụ nke mba ụwa a kpọrọ 'United Nations Population Division' weputara ụnyaahụ gosiri na ọdịghị otu a.

Nchọpụta ọhụrụ ahụ gosiri na ọnụọgụgụ ụmụnwoke karịrị nke ụmụnwanyi na Naijiria nakwa na mba ụwa.

Ụmụnwaanyị

Otu UN kwuru na ọnụọgụgụ ụmụnwanyi na Naijiria dị nde iri itoolu na itoolu, narị otu puku na iri atọ na abụọ (99,132,000).

Ha kwukwara na nke ndị nwoke di otu nde narị na otu, puku narị asatọ na iri atọ na abụọ (101,832,000).

Ha kwukwara na ọnụọgụgụ mmadụ nile nọ na Naijiria dị nde nari abụọ, puku narị itoolu na iri isii na anọ (200,964,000).

Nchọpụta ndị UN mere gosiri na ọnụọgụgụ ụmụnwanyị akala nke ụmụnwoke.
Nkọwa foto, Nchọpụta ndị UN mere gosiri na ọnụọgụgụ ụmụnwanyị akala nke ụmụnwoke.

Ọnụọgụgụ Afrịka na mba ụwa

Nchọpụta ahụ gakwara n'ihu kwuo na ọnụọgụgụ ndị mmadụ nọ n'ụwa ugbua dizi ijeri asaa, narị nde asaa na iri na atọ, puku narị ano na iri isii na asatọ (7,713,468,000).

Ụmụnwoke nwoke n'ime ha di ijeri atọ, narị nde asatọ na iri asatọ na itoolu, na puku iri atọ na ise (3,889,035,000), ebe ụmụnwanyị dị ijeri atọ, narị nde asatọ na iri abụọ na anọ, puku narị anọ na iri atọ na anọ (3,824,434,000).

Ọnụọgụgụ mba Afrịka dị otu ijeri na nde atọ na ụma, ebe ọnụọgụgụ mba ụwa dị ijeri asaa na nde asaa na ụma (7.7 billion).

A na-ele anya na tupu afọ 2030, ndị ọnụọgụgụ ndị mmadụ n'ụwa ga-erugo ijeria asatọ na nde ise na ụma (8.5 billion). ọnụọgụgụ a ga-arị ruo ijeri itoolu na nde asaa na uma (9.7 billion) tupu afọ 2050.

Akụkọ ga-amasi gị: