Nigeria Airways: Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ụgwọ a ga-akwụ

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

N'agbanyeghi na o were afọ 15 tupu gọọmentị ekweta ịkwụ ndị Nigeria Airways ụgwọ ruru ha n'ọrụ, ọbụghị onye niile nabatara atụmatụ a.

Ụfọdụ na-ekwu na enwereike ọtụtụ ndị kwesịrị irite ego a anwụfuola n'ahụhụ, ebe ndị ọzọ na-ekwu na ọ ka mma na a kwụrụ ya karịa na ndị otu Nigeria Airways rụrụ ọrụ n'efu.

Minista na-ahụ maka akụnaụba Naịjirịa bụ Zainab Shamsuna Ahmed, kwukwara na n'ezie, ọ ma na ọtụtu ndị ọrụ a tara ezigbote ahụhụ.

Ihe ndị mmadụ kwuru maka ya

Ụfọdụ kwuru na ọ bụ maka ntuliaka 2019 na-abịa mere ka Onyeisiala Muhammadu Buhari kwenye ịkwụ ụgwọ a, ebe ndị ọzọ na-ekwu na ha achọghị ịma ihe mere e ji akwụ ya, ma ha gaa n'ihu kwụọ ya.

Ndị ọ dị obiọma

@Omojuwa bụ onye ọnụ na-eru n'okwu ọkachasị na soshal midia, kwuru sị na ọ dịghị mma na gọọmentị ji ndị a ụgwọ ihe ruchara afọ 15.

@Rouvafe kelere Buhari ma kwuo na ọ dịghị ofele mmadụ ịkwụ ụgwọ e ji ka afọ 15 gachara.

@DrJoeAbah bụ onye ọzọ ọnụ na-eru n'okwu na Naịjirịa, kwuru na obi ụtọ ya bụgodi na a ga-akwụ ya bụ ụgwọ

"Ọ bụ maka ntuliaka"

@theDamorela kwuru na ọ bụ maka na ọ fọrọ naanị ọnwa ise tupu e mee ntuliaka.

@JohnGra60799908 kwuru na ọ bụ makana ntuliaka 2019 na-abịa.

@ije12002 kwuru na ntuliaka 2019 gachaa, gọọmentị ga-atụgharị ihe ha kwuru.

Ndị ma ndị o metụtara

@XclusiveDjmiles kwuru na ọ ma otu nwoke rụrụ ebe ahụ, ma kwuo na ọ ma na obi ga-abụ ya 'pọlịna pọlịna'

@Elhajyaks kwuru na achụpụrụ ha ebe ha bi maka ego a afọ ole gara aga, ma kwuo na ekpere ya bụ na ego a ga-erutekwa nne na nna ha aka.

@anthonykila kwuru na nna ya rụrụ ebe ahụ tupu ọ nwụọ, na ọ ga-agbado anya ịma ma isi aga apụtakwa n'okwu a.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: