You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Nigeria Air: Ụfọdụ ji ọdụ anya ele ya
Ọtụtụ ndị Naijiria na-adọrịta ụka banyere atụmatụ gọọmenti ikulite ụlọọrụ ụgbọeli Naijiria nwụrụ afọ 15 gara aga n'ọnwụ.
Ebe ụfọdụ na-eto atụmatụ ahụ, ọtụtụ ji ọdụ anya ele ya na-ekwu na o nweghị mkpụrụ ụkwa gọọmentị ga-apịpụta n'ime ya.
N'abali abụọ gara aga( abalị 18 nke ọnwa Julai,) gọọmenti etiti gbara ya n'anwụ na Naijiria ebidoghachila ụlọọrụ ụlọelu nke ala anyị nke a kpọrọ, 'Nigeria Air'.
Otu onye so n'ọnụ na-ekwuru gọọmentị etiti bụ Tolu Ogunlesi kwuputara nke a n'igwe okwu Twitter ya.
Ogunlesi kwuru na ọ ga-ebido ọrụ n'uju maka njem ụlọ na mba ofesi n'ọnwa Disemba.
Gọọmentị kwuru na ọ bụ iji gosi na naijiria ga-emenwu nnukwu ihe dị otu a.
Mana ụfọdụ ndị mmadụ na-akọta ụkwụ ije ọhụrụ a gọọmentị etiti na-azọpụ.
Ha gbadoro ụkwụ na-ajụ sị na nwa mbụ bụ Nigerian Airways ejeghị ije, ọbụzị nke abụọ bụ Nigeria Air ga-agba ọsọ?
@kesandu kwuru na akụkọ a bụkwa otu akụkọ mere na mbụ.
Dịka o siri bo n'ebubo, Virgin Nigeria bidoro n'afo 2005 ruo 2009 ka ọchịchị onyeisiala oge ahụ bụ Olusegun Obasanjo.
Virgin Atlantic jikọtara aka were hiwe ya; Virgin were oke 45%, Nicon nke Jimoh Ibrahim nwe were oke 50%, ebe gọọmenti were 5% mana emecha ọ kpụọ afọ n'ala dịka ọchịchị gọọmenti ekweghị mezu nkwekọrịta ha binyere aka..
@DondenBeke chere ihe yiri nke @Kesandu:
Ụfọdụ dịka@AdewaleOlukun na @Osike na-ajụ ajụjụ banyere imefu ego dị na ya.
@Osike jụrụ ajụjụ sị, ọ bụrụ n'ezie na ọ bụ naanị oke 5% ka gọọmentị etiti nwe n'ụgbọelu a, gịnị mere na ọ bụ ha bụ mgbasaozi maka ya n'isi?
Onye ọzọ bụ @ChikeMustafa na-ajụ ihe kpatara e jiri mefuo ụdịrị ego a maka pasentị ise mana mba Frans emefurughị ya na pasentị 31 oge ha tinyere ego na nke Virgin Atlantic.
Taiwo Tobo kwuru na ebe emere akara njirimara ụgbọelu nke a kpọrọ 'logo' na bekee na mba Bahrain, buta ya na London.
"Efuntoye Olayemi dụrụ ọdụ sị, "Ka anyị kwụsị iberibe igbado anya n'aha ụgbọelu a, tinye anya n'ọrụ ọ ga-arụ. Anyị aga agbado ụkwụ n'aha dịka ụgbọelu Turkish Air, Korean Air, Qatar Air, na ndị ọzọ."
Mana ọtụtụ dịka Oluyemi Fasipe na-ekwu na ọ bụ ihe dị ezi mma ka gọọmenti mere.
Akụkọ ga-amasị gị