You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Gọọmentị etiti ekwuola aha ọhụrụ ụgbọelụ Naịjirịa
'Nigeria Air' bụ aha ahọpụtara ga-abụ aha ụgbọelu Naịjịrịa nke gọọmentị etiti na-achọ ibido ọzọ.
Gọọmentị etiti kwuputara site n'akara soshal midia ha na Twitter na ụgbọelu ọhụrụ a ga-agba ụzọ njem ruru iri asatọ n'otu.
Ha kwukwara na ọ bụ njịkọ aka gọọmentị na ụlọọrụ ndị anọghị na gọomentị ka ugboelu a siri pụta.
Minista na-ahụ maka ihe gbasara njem ụgbọelu bụ Hadi Sirika kwuru na ụgbọelu ọhụrụ a bụ iji gosi na 'n'ezie Naịjirịa nwere ike ime ya'.
Ndị mmadụ ekwuputala uche ha gbasara akụkọ a, @odiase_destiny adọọla gọọmentị aka na ntị sị ha mụta ihe n'ụgbọelụ ochie daara ada tupu ha agbape nke a.
@MarkTariebi kwuru na gọọmentị kwesiri ị kpọ ya aha ọzọ.
Hadi Sirika kwukwara na a ga-ebuli ọdọ ụgbọelu ọzọ na Legos nakwa Abụja ma nabata ndị njem ruru nde iri n'otu.
O kwuru na 'Nigeria Air' ga ebido ọrụ n'ọnwa disemba nke afọ 2018.