You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
God is Good Motors: Ntọ ha tọrọ ndị njem anyị abụghị ihe atụwara anya
Ndị ụlọọrụ ụgbọala God is Good Motors ekwuola na ha atụghị anya cha cha na ndị ntọ ga-atọrọ ndị so ụgbọala ha eme njem.
Ọnụ na-ekwuchitere ha bụ ọkaikpe Paul gwara onye ntaakụkọ BBC na ọbụghị eziokwu na ndị ntọ a họpụtara ndị njem ha dịka ndị ha ga-atọ.
Paul kwuru na ndị ntọ a wakporo ndị ọrụ ụgbọala atọ ọzọ n'otu mgbe ahụ.
N'ọnụ okwu ya: "Ụbọchị ahụ, a tọrọ mmadụ itoolu n'ụgbọala anyị mana atọghapụrụ mmadụ abụọ n'abalị ahụ"
Paul sị na aka ha ka ihe ekechiri ekechi maka ka ihe a na-eme ezinaụlọ ndị a tọrọ agwaghị ha ihe na-eme.
Paul kwuru na ha agaghị enwe ike ikwusi ike ma ezinaụlọ ndị a tọrọ akwụrụ ego ntọghapụ makana onweghị ihe ọbụla ha gwara ndị ụlọọrụ ha.
"Anyị amaghị ma ha na ndị ntọ enwere nkwekọrịta ọbụla mana anyị nụrụ na onwere ụfọdụ n'ime ha kwụrụ ụgwọ ntọghapụ"
Ihe ga-eme n'ihu
God is Good kwuru na ha ga-ahụ ma ha a ga-enwe ike ịkwụ ego "insurance" oge ọbụla ndị omekome tọrọ ndị ahịa ha.
Mana egwu na-atụ Paul.
O kwuru na: "Ihe a nwere ike ibute nnukwu nsogbu makana ọ bụrụ na ndị ntọ mara na anyị na-akwụ ego "insurance" maka ntọ, ndị ntọ ga na-awakpo ndi njem anyị oge ọbụla".
O kwukwara na: "Ọ dịzị n'aka ndị nche obodo makana ha ma na ebe ahụ dị n'etiti Ọre na Ọkada bụ ebe ndị ntọ kachasị awakpo ndị mmadụ."
Ihe ndị uweojii kwuru
Femi Joseph bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii Ondo steeti gwara BBC Igbo na ọ bụ eziokwu na ndị ntọ torọ ndị njem God is Good Motors mana ha ka na-enyocha ya bụ akpamike.
Ọrụ ka na-aga
Oge BBC Igbo gara ụlọọrụ God is Good Motors na Jibowu n'ime Legọs, ọrụ ka na-aga etu o si aga na mbụ.
Mana ndị ọrụ ha gwara BBC Igbo na ha ma na ọtụtụ ndị mmadụ na-atụzị egwu maka ihe a mere mana ha ga na-aga n'ihu n'ọrụ ha n'agbanyeghi ihe a mere.
God Is Good gbasakwara akwụkwọ ozi ebe ha kelere ndị uweojii maka mbọ ha gbara n'emume a, ma kwuo na ha chere ka akpọpụtachaa ndị atọrọ tupu ha edepụta akwụkwọ ozi ahụ.
Akụkọ ga-amasị gị