You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ụzọ ọjọọ dị n'ala Igbo
N'ime inyocha ụzọ nke BBC Igbo mere, anyị chọpụtara na ọ bụ naanị otu ụzọ n'ime ụzọ anọ gbara Owere gburugburu ndị anyị gara bụ nke gọọmenti etiti nwe ka dị mma.
Nke a bụ ụzọ si Owere gawa Onicha, mana a bịa n'ụzọ si Owere gawa Portharcourt, ihe ruru kilomita iri abụọ adịghị mma chacha bụ nke na-akpabeghi aka n'ime ọtụtụ afọ gara aga.
Nke a mere ndị ọkwọụgbọala na-agba ụzọ ahụ ji ebe akwa, na-arịọ gọọmentị etiti ka ha gbatara ha ọsọ enyemaka.
N'ụzọ Ụlakwọ, nke si Owere gawa Aba, anyị hụrụ ngwaọrụ ndị na-arụ ụzọ mana o nweghị ndị mmadụ na-arụ ụzọ anyị hụrụ.
Ndị bi gburugburu ebe ahụ kwuru na o ruela ọnwa isii ndị ọrụ a bidoro ikewa ụzọ ahụ abụọ.
Nke si Owere gawa Umuahia ka nwere ọtụtụ ebe na-adịghị mma.
Otu onye ọkwọụgbọala kwuru na ọ karịala ihe ruru afọ iri na isii a rụrụ ọrụ n'ụzọ ahụ.