Bafarawa: 'E nyegodị Buhari afọ 20 ọ gaghị edozinwụ Naijiria'

Ebe foto si, Attahiru Bafarawa-Facebook
Attahiru Bafarawa, ọnye na-azọ ọkwa onyeisiala n'otu PDP kwuru nke a n'Owere, isiobodo Imo steeti.
Bafarawa gara Owere ịgba mbọ inweta ndị nkwado maka ntuliaka na-abịa na 2019.
O kwuru na nsogbu Naijiria bụ na ndị ekwesighi ịnọ n'ọkwa ọchịchị bụ ndị nọ na ya.
"I nye Buhari afọ 20 dịka onyeisala Naijiria, ọ gaghị edozinwu Naijiria. Ihe ọ ma bụ ịga China ịga bite ego. O si etu a gaa n'ihu, ụgwọ anyị ga-eji agaghị agbakọtanwụ ya.
Ọ gwara ndị otu PDP ka ha tụnyere onye ga-emerinwu na ntuliaka 2019 dịka onyeisiala..
" Ọ dị mkpa ka anyị kwekọrịta isi na ntuliaka chụda Buhari. Ịchụda Buhari dị mfe ma takwaa akpụ.
"Ọ ga-adị mfe ma ọ bụrụ na ndị na-achọ ịzọ ọkwa onyeisiala na PDP họrọ m."
Ọ bụghị tigbu zugbuo..









