Akụkọ dị mkpa n'ịchafụ : Kpochapụ ndị nchekwa juru n'ụzọ ọwụwa-anyanwụ Naịjirịa - Sineti
Akụkọ ndị kachasị mkpa
Kpochapụ ndị uweojii na ndị agha n;ụzọ mpaghara ọwụwaanyanwụ - Ndị Sineti

Ebe foto si, @Senatepresident
Ndị Sineti agbarụọla ihu n'ihi oke mgbochi ụzọ ndị agha nakwa ndị uweojii hiwere n'ụzọ ndị dị na mpaghara ọwụwa anyanwụ nke Naịjirịa.
Ha gwara gọọmentị etiti ka ha kpọchapụ ihe mgbochi ụzọ ndị a iji mee ka mbubata ngwa ahịa dị mfe na-mpaghara ahụ.
Buhari etinyela aka n'akwụkwọ iwu megidere mpụ

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala Mohammadu Buhari etinyela aka n'akwụkwọ iwu ga-akpachị akụnaụba onye ọbụla ma ọ bụ ụlọọrụ ọbụla achọpụtara na-eme mpụ ego dị ịche iche.
Nke a bịara n'ime otu ụbọchị Buhari kwupụtara usoro ọ ga-eji buo agha megide mpụ na nrụrụaka ego.
Akụkọ si mba ofesi

Ebe foto si, EPA
Otu onye ọkacha n'igwu mmiri bụbụ onye agha mmiri mba Taịland anwụọla dịka oso na-agba mbọ ịkpapụta ụmụaka ahụ tọrọ n'ọgba dị na Taịland
Nwoke a aha ya bụ Saman Gunan kubiri ume n'ime mmiri dịka o bugachara ndị tọrọ n'ime ọgba ahụ ihe.
N'egwuregwu

Ebe foto si, Getty Images
Otu na-ahụ maka egwuregwu bọọlụ n'Afrịka bụ CAF ahọpụtala onyeisi ndị NFF bụ Amaju Pinnick dịka osote onyeisi nke mbụ nke otu ahụ
Nke a bụ site n'ọgbụgba arụkwaghị m n'ọrụ Kwesi Nyantakyi nke Ghana bụ onye ji bụ ọkwa ahụ gbara maka ebubo mpụ na nrụrụaka.
Gee akụkọ anyị n'otu nkeji
Lee ihe nkiri anyị











